Meghan Markle Baby: Ọ bụ nwa nwoke!

Harry na Meghan

Ebe foto si, Reuters

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu na Meghan Markle abụrụla nne dịka ọ nwụrụ nwa nwoke.

Ọ mụrụ nwa ya n'ehihie ụbọchị Monde bụ 6 nke ọnwa Mee.

Ọkparaeze Harry gosiri obi aṅụrị ya site n'ozi ọ gbasara n'akara Instagram ya:

Skip Instagram post
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post

Akara ntụ-ntụ

Ihe ị maghị maka ọkparaeze ọhụrụ a mụrụ:

  • A mụrụ ya n'elekere ise nke ụzụ ụtụtụ (5:26am) n'ụbọchị Monde 6 nke ọnwa Mee.
  • Ọ na-ada 7lbs 3oz ya bụ 3.2kg.
  • Ọ ga-abụ mmadụ asaa nọ n'ụzọ oche eze mba Briten.
  • Ọ bụ nwanwa asatọ nke Ezenwaanyị Elizabeth na mba Briten.
Akara ntụ-ntụ

"Obi dị anyị aṅụrị, ihe a bụ ihe ịtụ anya m hụrụ na ndụ m" ka Ọkparaeze Harry gwara BBC.

O kwukwara na ọ ga-agbasa ozi ọzọ n'ụbochị abụọ na-abịa ka mmadụ niile nwee ohere hụ nwa ọhụrụ ahụ.