Whale Ashore: Ndị obodo Brass na Bayelsa abanyela oriri

Ndị mmadụ na-egbuka anụmanụ ahụ

Ebe foto si, Ebi Johnson

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Ndị mmadụ bi na okpuru ọchichị Brass dị na Bayelsa steeti na aṅuri ọnụ dịka ha hụrụ anumanu a na-akpọ 'Whale' na Bekee n'oke oshimiri ha.

Berebofe Ebi-Johnson bu nwaafọ Opkoama gwara BBC na nkea bụ ugboro atọ udiri ihe na eme n'oke oshimiri ha.

O kwuru na ọ bụ n'afo 1983 na 1984 ka ha hụrụ ụdịri ihe a tupu nke a e mee kama ha amaghị ma anụ a a dị ndụ ka ọ nwụrụ anwụ.

Ka o si di ugbua, ha ka na eke anụ a kemgbe sundei ihe a mere.

Ọgbaaghara dapụtara n'ụlọnga Brazil ataala isi mmadụ iri ise

Ọgbaghara n'ụlọ nga Brazil n'afọ 2015

Mkpmkpa a bidoro dịka otu ọjọọ hapụrụ ebe ha bi na ya bụ nga were nwakpo ndị bị ebe ọzọ nke mere ka ọgụ bido.

N'ime mmadụ 50 nwụrụ, mmadụ iri na isii bụ ndị ebepụrụ isi na ogbaaghara a.

Ndị nọ na nga na mba Brazil

Ebe foto si, Getty Images

Ndị ụlọmkpọrọ a weputara akwụkwọ maka ihe mere na-akọwa na amụnyere ọkụ na ụlọnga ahụ nke mere ka aṅụrụọkụ gbuo ụfọdụ ndị.

Henry Onyekuru ebidola njem n'otu bọọlụ Galatasaray

Henry Onyekwuru

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu bọọlụ Galatasaray ebidola ije íbitekwa Henry Onyekuru n'aka Everton maka afọ ọhụrụ.

Cheta na Onyekuru enyela Galatasaray aka maburu iko n'asọmpị abụọ otu ahụ gbara n'ala Turkey mbụ.

Lekwa Chimamanda Adichie n'ihu Vogue!

Chimamanda Adichie

Ebe foto si, Getty Images

Ada Igbo bụ Chimamanda Adichie esorola na umunwanyi ndị na egbuke ka kpakpando n'ihu akwụkwọozi Vogue.

Akwụkwọozi nkea kacha puọ iche n'ihi na ọ bụ Meghan Windsor onye bụ "Duchess of Sussex" bipụtara ya.

Meghan bipụtara akwụkwọozi nke a iji were gosipụta ụmụnwanyị kwaturu ihe mgbochi dị icheiche.

Akwụkwọ mmachị ahụ bụ adigboroja

Aha onyonyo, Ebubo na ụta na-aga n'ihu maka ihe mere na ụlọahịa nwunye Rochas Okorocha

N'aka nke ozo ka Uloma Rochas Nwosu na etisi mkpu ike na akwụkwọ ha ji wakpo ụlọ ya bụ adigboroja.

Onyeisi ngalaba na-ahu maka inakọta ego niile ezurufuru ndị gọọmentị Imo steeti bụ Jasper Ndubuaku ekwuola na ha natara akwukwọ ikike ha na Magistrate Court nke Anambra steeti.

Ndị mmadụ nwụrụ na mwakpo ndị Boko Haram wakporo otu obodo na Maiduguri arịala ruo mmadụ iri isii na ise.

Obodo Boko Haram wakporo

Ebe foto si, Getty Images

Muhammed Bulama bụ onyeisi okpuruọchịchị ebe ya bu ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ iri abụọ na atọ ka Boko Haram gburu mgbe ha sị ụlọakwa alọta, ebe mmadụ iri anọ na abụọ nwụrụ mgbe

hachụwara ndị Boko Haram ọsọ.

Nwada Igbo bụ ọkaibe n'ule WAEC 2019

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ugboaja Chizobam Stephanie dị afọ iri na isii abụrụla ọkaibe dịka ewepụtachara mpụtara ule "West African Examination Council WAEC) nke 2019.

Ugboaja bụ onye Imo steeti gụrụ akwụkwọ na Port Harcourt nwere A1 na sọbjekt ruru itolu o lere na WAEC.

Ka ọ dị ugbua, akụkọ na-ekwu na otu onye Naịjirịa nọ na mba ofesi enyela ya ohere ka ọ bịa gụọ akwụkwọ n'efu na mahadum dị na mba ofesi.

Egbe agbara n'emume oriri na nkwarị e mere na California

EPA

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ndị ọrụ gbata gbata gbatara n'ebe ahụ ozugbo ozugbo

Mmadụ atọ anwụpịala ebe mmadụ iri na ise merụrụ ahụ ka o ji egbe egbu gbapụrụ egbe n'emume nri n'obodo California dị na mba US.

Ndị uweojii gbaturu oji egbe egbu ahụ ka otechaghị aka o bidoro gbapụwa egbe.

Mmemme ahụ akpọrọ "Gilroy Garlic" na-abịa na njedebe mgbe nwoke ahụ bidoro gbawa egbe ebe ahụ.

Nkata ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na-akpa

Ọwụwa anyanwaụ

Ebe foto si, Presidency/Twitter

Nkọwa foto, Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ Naịjirịa

Otu jikotara ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ ekwekọritala ihibe ngalaba ga na-elekọta ihe gbasara nchekwa na mpaghara ahụ niile.

Nke a bụ otu n'ime ihe ha kpebiri n'ọgbakọ mbụ ka mgbe ha weghara ọchịchị ha nwere n'Enugwu unyaahụ, ebe ha nọkwara kwuo hoo haa na ha enweghị ala ha ga-enye gọọmentị etiti maka RUGA.

Eze pụọ, eze anọchie n'Amerịka

Coats

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dan Coats na Trump na-enwekarị esemokwu gbasara Iran, North Korea, na Russia

Na mba ofesi, onyeisi na-elekọta ụlọọrụ nnyopu na nchekwa na mba Amerịka bụ Dan Coats agbaala arụkwaghị m.

Onyeisiala Donald Trump ahọpụtalarị onye ọzọ aha ya bụ John Ratclifee dịka onye ga-anọchị anya ya.

N'egwuregwu,

Gauff

Ebe foto si, Getty Images

Nwatakịrị nwanyị onye Amerịka aha ya bụ Coco Gauff etozuola isonye na asọmpi Washington Open mgbe o meriri Hiroka Kuwata nke mba Japan ụnyaahụ.

Gauff onye gbara naanị afọ iri na ise pụtara ihe n'asọmpi Wimbledon nke e mere n'ọnwa gara aga ebe ọ nọrọ merie onye tennis a ma ama bụ Venus Williams.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri

Aha onyonyo, Etu esi ahazi Ji Kpacha