'Anyị agaghị akwụsị ngagharịiwe tutu a kwụsị igbu ụmụ Naijiria na Saut Afrịka'

Ebe foto si, Kwara Reporters News

Ebe foto si, NANS
Ndị otu NANS ekwuola na ha ga-emegide ngagharịiwe ma mechie ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nille dị na 36 steeti dị na Naijirịa ma ọ bụrụ na ndị Saut Afrịka akwusighị igbu ndị Naịjirịa nọ n'be ha.
Ụlọọrụ ndị gụnyere MTN Nigeria, Shoprite, Dstv, Gotv, Standard Chartered Bank na ndị ọzọ.
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Onye na-ahụ maka mgbasa ozi onyeisi ndị NANS bụ Wande Ajayi kwuru si " Ndị nnọchite mba Saut Afrịka na Nigeria akpọọla anyị oku maka ngagharịiwe anyị mere, mana anyị agaghị aza ha tutu ruo mgbe ndị Saut Afrịka kwụsịrị igbu umunne anyi ndị Naịjirịa nọ n'obodo ha".
N'aka nke ọzọ, onyeisi ndị NANS na Saụt Afrịka bụ Ozoemena Nwamadị na-ariọ ka ndị ogbo ha nọ Naijiria ghara ime ọgbaaghara maọbụ mebie ihe ndị Saụt Afrika dị na Naijiria.
O kwuru na nke nwere ike imetụta ndị Naịjirịa nọ na Saut Afrịka.

Ebe foto si, Ozoemena Nwamadi
Ka akụkọ na-aga, Onowo Ndigbo bi na Saut Afrịka kwadoro oku ndị ụmụakwụkwọ NANS na-akpọ ka akwụsị igbu ndị Naijiria na Saut Afrịka ma na-ekwukwa na ọ ga-adị mma ma ndị otu ọzo na Naịjirịa tinye ọnụ n'okwu ahụ.

Ebe foto si, Jonas Udeji
Cheta na ọtụtụ ndị mmadu nke gụnyere Peter Obi, Ahmad Lawan, HURIWA na onyeisi ndị NLC bụ Ayuba Wabba, akpọọla oku ka a kwụsi igbu ụmụ Naịjirịa na Saut Afrika.






