Anambra flood: Idemmiri achụpụla mmadụ karịrị 2000 n'ụlọ ha n'Anambra state
Idemmiri na-abịa kwa mgbe kwa mgbe n'oge udummiri ebutela nnukwu ihe ọdachi n'Okpoko dị n'Anambara steeti.
Ndị bi n'ogige ahụ kọwara etu idemmiri si enye ha nsogbu ma kwuo etu o si chụọ ihe ruru mmadụ puku abụọ (2000) ụkwụ eru ala.
Mgbe BBC rutere n'Okpoko, anyị chọpụtara na ebe ndị o metụtara gụnyere Ogbagu, Ede Rd, Amiri St, Ahịa Ojoto, Ezeakunne st Okpoko 1, School rd- Mgbemena nakwa Obodoukwu; ha niile dị n'Okpoko.

Otu nwoke idemmiri mebiri ụlọ ya bụ Izuchukwu Ozobi kwara arịrị na ya enweghịzị ebe ya na-arahụ nke o ji enwe ihe ọbụla e ji ebi n'ụlọ o wepụtanwuru n'ụlọ ya.
Izuchukwu kwuru na mmiri na-emebi ụlọ na ngwongwo ndị mmadụ oge niile na-esi na Mgbemena, Awada were na-awụdata n'Okpoko n'ihi na Okpoko nọ na ndịda.

Nwaanyi na-azụ ahịa n'Okpoko bụ Ego Kingsley bere akwa, rịọ gọọmentị ka ọ gbatara ya ọsọ enyemaka n'ihi na naani ya na ụmụ ya fọdụrụ n'ụlọ ha mmiri tochiri.
Nwaada Ego kwuru na mmadụ niile bi na ya bụ ụlọ agbaala ọsọ mana ya onwe ya enweghị ebe ya ga-agbaga, tinyekwara na idemmiri ahụ mebiri akpa osikapa asaa na ngwaahịa buru ibu ọ na-ere ere.

Ndị ọzọ bikwa n'Okpoko ji obi mwute wee na-akọwa na ibi ndụ n'ime Okpoko bụ ịchị obi n'aka.
Ndị na-azụ ahịa na ndị ọkwọụgbọala na Keke kwuru na ogbe ha dị ka nke ndị gọọmentị Anambara steeti chefuru echefu.

Ọtụtụ bi n'ime Okpoko nke dị n'ogige Ọnịcha na-agazị na be ndị enyi na ikwu na ibe ha arahụ n'ihi na idemmiri emebisiala ụlọ ha.

Lee ihe nkiri gbasara etu idemmiri si chụọ ndị mmadụ n'ụlọ ha n'afọ 2018:
Lee ya n'uju n'ihe nkiri dị n'elu.










