Imo State: E kposaala ndịisioche okpuruọchịchị 27

Ikpe nkwụmọọtọ

Ebe foto si, Uche Akolisa

Nkọwa foto, Ikpe nkwụmọọtọ bụ oke dịrị mmadụ niile
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

N'ụbọchị Tọzdee, Ụlọomeiwu Imo steeti kposara ndịisioche nke okpuru ọchịchị iri abụọ na asaa na steeti ahụ.

Ndị omeiwu a gwaziri ha ka ha nyefee ọchịchị n'aka ndị osote ha.

A na-ebo ndịisioche a ebubo na ha nupụrụ isi ịbịa kọwaa ka ha na ije siri gaa kamgbe ha weghara ọchịchị n'uloomeiwu steeti ahụ.

Mana otu onyeisioche okpuruọchịchị na-achọghị ka akpọọ aha ya, boro ndị uloomeiwu ahụ ebubo na ha kposara ha n'ihi na ha jụrụ inye ha ego aka azụ.

Onyeisiala enyela Emefiele ikike agba nke abụọ

Godwin Emefiele

Ebe foto si, PHILIP OJISUA

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua bụ na Godwin Emefiele bụ onyeisi ụlọakụ etiti ga-abịaghachi ọzọ.

Okwu a si n'akara ekwentị onyeisioche ụlọmeiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Bukola Saraki.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Cheta na a nụrụ kepukepu na ọ gaghị enweta ohere agba nke abụọ maka na onyeisiala sị ya gaa ezumike.

Mana ọnụ na-ekwuchitere ụlọakụ etiti bụ Isaac Okoroafor gbaghara nke a kwuo na ọ bụghị eziokwu.

Na mba ofesi

Onye ga-emeri na Sawut Afrịka?

Ka anyị gaa na Sawụt Afrịka ebe ngụpụta ihe karịri ọkara vootu niile a tụrụ na ntuliaka mba ahụ gosiri na otu ndọrọndọrọ bụ Africa National Congress bu ụzọ ugbua

Otu Democratic Alliance so ya n'azụ, ebe otu Economic Freedom Fighters nọ n'ọkwa nke atọ.

Okwu Chuwkwueze ebiela

Samuel Chukwueze

Ebe foto si, Getty Images

Akụkọ na-eru anyị ntị n'egwuregwu e kwuola na otu Villareal emechala hapụ Samuel Chukwueze ka o gbara N aịjirịa bọọlụ n' asọmpị iko mba Afrịka nke na-abịa.

Chukwueze ga-eso ibe ya malite ọzụzụ n'Asaba n'ọnwa Juun.

Gee Nkeji ebe a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Onyeisi ndị uweojii amapụtala amụma ịkpa ndị ntọ eze

Ndị uweojii

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii azọpụtala mmadụ 27 a tọrọ gụnyere ndị Chaina mmadụ ise.

Mmadụ iri na abụọ n'ime ha bụ ndị a tọrọ na Zamfara steeti na steeti ndị ọzọ,ebe ndị Chaina ise ahụ bụ ndị a tọrọ na Bobi dị na Naija steeti n'abalị 15 nke ọnwa Eprelu afọ a.

Mana ndị uweoji siri imi n'ala ma gbapụta n'ọhịa dị na Birnin Gwari, Kaduna steeti.

N'ozi ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Naijiria bụ Frank Mba wepụtara, a gbagburu ndị ntọ abụọ dịka ha na ndị uweojii na-akwa mgbọ.

N'otu aka ahụ, onyeisi ndị uweojii Naijiria bụ Mohammed Adamu nọrọ n'Abuja ụbọchị Tọzde malite atụmatụ ọhụrụ a kpọrọ 'Operation Puff Adder' maka iji buo agha megide ntọ na Naijiria.

Adamu kwere nkwa na njedebe mkpamkpa ndị omekome adịla nso.

Rochas akwaala arịrị

Gọv. Rochas Okorocha
Nkọwa foto, Gọv. Rochas Okorocha

Rochas Okorocha na-akwa arịrị na-ekwu na ajọ agwa a kpasoro ya n'APC dị njọ ugboro iri karịa ihe ya gaara eme ya maọbụrụ na ọ na PDP.

Mgbe ọ gwara ndị ntaakụkọ nke a n'Abuja Okorocha sị na agbanyeghị nke a na ọ ka kwụchịm na Pati APC.

NLC ahụla ihe ha atụghị anya be Ngige

NLC

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, NLC mere ngagharị iwe be Ngige

N'otu Abuja ahụ, ịkwe n'aka agafeela mpi aka n'okwu dị n'etiti Nigeria Labour Congress na Mịnịster ndị ọrụ bụ Chris Ngige.

Ndị a sịrị na ha bụ ndị agboro merụrụ ndị NLC ahụ ebe ha na-eme ngagharị iwe n'ihu ụlọ Chris Ngige n'Abuja. Mmadụ itoolu n'ime ndị ọrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ n'ụlọọgwụ ugbua.

Ụlọikpe mkpegharị ewetuola Adeleke aka

Gboyega Oyetola na Ademola Adeleke zọkọra ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018

Ebe foto si, @Gboyegaoyetola/@IsiakaAdeleke1

Nkọwa foto, Ademola Adeleke zọrọ ọkwa gọvanọ Osun n'afọ 2018

Unu anụla na Ụlọikpe mkpegharị dị n'Abuja sị na ha ekweteghị n'ihe ụlọikpe nta kwuru na ọ bụ Sịnetọ Ademola Adeleke meriri na ntuliaka gọvanọ Osun Steeti.

Ụlọikpe nta kwuru na Ademola Adeleke bụ onye ji ọkọlọtọ PDP zọọ ọkwa gọvanọ meriri Gboyega Oyetola nke APC na tulaika gọvanọ e mere na steeti ahụ.

Nke a mere Gboyega Oyetola nke APC na-achị steeti ahụ jiri rịọwa ụlọikpe mkpegharị ka ha lebe anya na ya bụ ikpe.

Ntuliaka Sawụt Afrika

Onyeisi ANC bụ Cyril Ramaphosa

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ramaphosa ga abụ onyeisiala ma Zuma rituo

Na mba South Africa ka atụm vootu na-abịa n'isi njedebe, onyeisiala ha bụ Cyril Ramaphosa arịọla ọhanaeze mgbaghara maka oke mpụ na nrụrụaka ọ sị kechiri mba ahụ ọkpa.

Ya bụ onyeisiala so na-azọ ọkwa na-arịọ ka a gbaghara patị ha bụ ANC ma nyekwa ha ohere ọzọ ịdozi ya bụ mba.

BBC achụọla onye ntaakụkọ ha

Danny Baker onye nta akụkọ BBC

BBC achụọla onye ntaakụkọ ha maka akụkọ ịkpa oke agbụru o dere n'akara Twitter banyere nwa ọhụrụ ọkparaeze Harry na Meghan mụrụ n'ịzuụka a.

Danny Baker gosiri foto dị na nwunye du adaka yị uwe dee na "nwa Eze ahapụla ụlọọgwụ".

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Otu a ka Danny sị jiri aka ya detere onwe ya ajọ ihe.

Ajax 2 - 3 Tottenham

Tottenham

Ebe foto si, Getty Images

Ụmụibe egwu tara akpụ ụnyaahụ n'etiti Ajax na Tottenham ebe ọfọrọ tinkọm tinkọm ole ka egbuchie ya bụ asọmpi mgbe Lucas Moura tinyere goolu nyere Tottenham mmeri.

Tottenham ji ọkpụ atọ asatara abụọ merie Ajax nke mere na ha na Liverpool ga-akwata n'agba nke ikpeazụ.

Gee Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Lee ihe nkiri nke taa

Aha onyonyo, Night runners: 'Ịta amusu dị n'agbụrụ ezinaụlọ anyị'

Akụkọ ga-amasị gị