EFCC asaala Saraki: 'Anyị nwere ihe akaebe megide gị'

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

EFCC asaala Saraki: 'Anyị nwere ihe akaebe megide gị'

Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye kwuo uche ya

Ebe foto si, @bukolasaraki

Nkọwa foto, Ndị Sịnetị a bụ nke onyeisi ha bụ Bukola Saraki bụ nke agba asatọ n'ime ọchịchị onye-kwuo-uche-ya

EFCC na Bukola Saraki na-achịpụzị ya ugbua dịka ha na-arụrịta onwe ha aka n'ọnụ.

N'ozi ngalaba gọọmenti ahụ na-ebu aga megide nrụrụaka wepụtara na Wenezde, ha kwuru na ha nwere ihe akaebe zuru ha inyocha ihe Saraki mere oge ọ bụ gọvanọ Kwara steeti nakwa ụlọomeiwu.

Saraki site n'ọnụ onye na ekwuru ya bụ Yusuph Olaniyonu boburu EFCC ebubo 'ịta ya amusu' dịka ọ rụụ aka na ọ bụ ndị ndọrọndọrọ ọchịchị ndị na-achọ ịchụ ya ọbọ bụ ndị ziri EFCC ha chụwa ya.

Mana ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade kwuru na 'ọ bụ maka ọdịmma ọha nakwa ọdịmma Saraki na-enyeochara gosi n'aka ya dị ọcha.'

"E nwere ọtụtụ akwụkwọ mkpesa e detara nakwa ihe akaebe megide Sararki e detara EFCC nke na Saraki na onwe ya ga-ekweta na ọ ka mma ka e tinye anya na mmiri were nyocha ọrụ ya dịka odibo ọha."

Ego mbute akpụpụla ụmụnne atọ ụlọmkpọrọ

Onye anwúchiri

Ebe foto si, Getty Images

Ikpe amaala ụmụnne atọ maka nrụrụaka n'ego ruru otu nde pounds na mba Briten.

Okemiorukaye Nakpodia, Unuakpotovo Nakpodia na Esther Nakpodia bụ ụmụ Naijiria ndị ji ọbaego dị na Naịjirịa arụ akụrụka.

Onye kwụ chịm ka okwute?

Peter Obi

Ebe foto si, Val Obienyem

Onye zọrọ osote onyeisiala Naịjirịa n'okpuru otu PDP bụ Peter Obi ekwuola na ọ kwụ chịm ka ukwu ọjị.

Ka a na-ekwu nke a, Obi febara Abuja ebe ọ gara ụlọikpe pụrụiche ehibere iji nyocha mpụtara ntụlịaka afọ a.

Aha ya bụ...

Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

A gụọla nwa ọhụrụ ọkparaeze Harry nke mba Briten aha

A gụrụ ya Archie Harrison Mountbatten-Windsor, ya bụ "Harry" dịka nna ya.

Akụkọ BBC Igbo na nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Buhari ehiwela North-East Development Commission

Muhammadu Buhari

Ebe foto si, Mbuhari

Onyeisiala Muhammadu Buhari ehiwela North-East Development Commission nke a mapụtara ijeri Naira iri(N10bn) maka mbido ya.

Onyeisiala Muhammadu Buhari kpọpụtara Generalụ Paul Tarfa dịka onyeisioche ụlọrụ ọhụrụ.

Ụlọọrụ ahụ ga-ahụ maka iwugharị obodo mkpamkpa ndị Boko-Haram kpụrụ isi n'Ọwụwa-Anyanwụ Ugwu Naijiria.

E mere emume mgbape kọmịshọn ahụ n'obi gọọmenti etiti n' Abuja n'ụbọchị Wenezde.

Gịnị mere Annie Idibịa, nwunye Tuface ji ewu na soshal midia?

Anne Idibia

Ebe foto si, Annie Idibia

Aha Annie Idibia, nwunye otiegwu a ma ama na-ewu na-akpọtụ akpọtụ na soshal midia maka ọnwụ nna ya bụ Macaulay onye nwụrụ n'ọrịa kansa.

Anne, onye Akwa-Ibom kwupụtara maka ọnwụ nna ya n' igwe okwu Instagram ya ebe ọ nọ kele nna ya laa n'udo.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Ọtụtụ ndị a ma ama dịka Banky W na-ekelekwa ya n'ọnwụ nna ya.

Ụmụ Naijiria sonyekwara Annie na-atụ arịrị maka ọnwụ nna ya.

Ndị uweojii wakporo nwaanyị ga-ata ahụhụ

Ngagharịiwe maka etu esi anwụchikọ ụmụnwaanyị

Ebe foto si, BBC

Ntaram ahụhụ ga-adịrị ndị uweojii ọbụla aka ha dị na idina nwaanyị n'ike.

O bụ Adamu Mohammed, onyeisi ndị uweojii mgbe ọ na-ekwu maka ndị otu ha eboro ebubo ịwakpọ ụmụnwaanyị n'ike bụ ndị ha jidere n'ụlọawantilo n'Abuja.

NLC na Ngige ga-achipụ ya

Ndị ọrụ NLC

Ebe foto si, AFP

N'otu Abụja ahụ ụnyahụ ka onyeisi ndị ọrụ Bekee bụ Ayuba Wabba nọ foro ntutu taa na ya ga-eme ka ihe siere Chris Ngige ike na ọnọdụ ọrụ ya,

Waba n'ekwu na Ngịge jị aghụghọ na-akpachapụ ido n'iyiọrụ ndị ahọpụtara n'isi Nigeria Social Insurance Trust Fund.

Ogbunigwe na Pakistan

Pakistan

Ka anyị feega Pakistan ebe ogbunigwe gburu ihe dịka mmadụ abụọ na ụlọekpere ndị alakụba nke ndị otu Sufi dị na Lahore.

Akụkọ n'eru anyị ntị na-ekwu na ọtụtụ mmadụ meruru ahụ ebe ahụ.

Liverpool 4 - 0 Barcelona

Messi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Merenụ Messi "mercy"

Ka anyị bata n'egwuruegwu ebe ụzụ tụrụ ụnyahụ na Liverpool batara na agba nke ikpeazụ site na iji ọkpụ anọ merie Barcelona.

Nke a bụ nke ugboro abụọ ha na-abata n'agba nke ikpe azụ n'otu ahịrị n'egwuruegwu Champions League.

Nkeji

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Akụkọ ga-amasị gị