Boko Haram Kidnap: Ha na-ana N100m n'isi Abraham Amuta

Ebe foto si, Abraham Amuta/Facebook
Ndị a na-eche Boko Haram tọọrọ otu nwoke ji otu afọ efe ala nna aha ya bụ Abraham Amuta nakwa onye ụkọchụkwụ ndị Living Faith na Borno Steeti sị ka akwụọ ha otu nde narị Naịra ka ha were
hapụ ya bụ nwaamadị.
Ndị enyi Amuta sị na ndị Boko Haram a jidere ya izuụka abụọ gara aga ebe ha gara ibunye ndị gbara ọsọ ndụ nrị ma zisakwa ozi ọma, dịka ha kwuru n'akara Twitter ha.
Ha sị na ha nọ n'ụgbọala ha na ndi ọzọ mgbe mkpamkpa a kpara.
Ya bụ otu nwa nne ya, ji otu efe alanna na Batch B stream 1 dị na Maiduguri, Borno steeti.
Ọ bụkwa enyi Amuta aha ya bụ Success Ezeanya bụ onye zipuru ozi a n'akara Twitter sị na o nwere ndị kpọrọ sị na ha bụ ndị otu Boko Haram kwuru na ha ji Amuta eji.

Ebe foto si, Abraham Amuta/Facebook
Ezeanya rịọrọ n'akara twitter ya sị, "O ruola izuụka abụọ achọwara Abraham Amuta.
Ndị sị na ha bụ ndị Boko Hara kpọrọ n'ekwentị sị na ọ bụ ha tọọrọ Abraham. Biko onye ọbụla zisawa ozi a ka o rụọ ndị isi ọchịchị aka".
Ka Borno sị dị egwu, a na-enye ndị ji otu afọ efe alanna ohere ị sị na ha agaghị aga ebe ahụ.
Nke a mere ka ihe ruru narị asatọ mmadụ sị na ha agaghị aga ebe ahụ ife alanna ha kemgbe ọnwa Nọvemba gara aga.
Akụkọ ga-amasị gị

Ebe foto si, Abraham Amuta/Facebook
Ndị e chere bụ ndị Boko Haram tọọrọ otu nwoke na-efe ala nna ya bụ Abraham Amuta.
Ndị otu ahụ anaala ego mgbapụta bụ otu nde narị naira n'isi Amuta bụkwa onye ụkọchụkwụ ụlọụka Living Faith na Borno Steeti.
Ndị enyi Amuta sị na ndị Boko Haram a jidere ya izuụka abụọ gara aga ebe ha gara ibunye ndị gbara ọsọ ndụ nrị ma zisakwa ozi ọma.
Ha sị na ha nọ n'ụgbọala ha na ndi ọzọ mgbe mkpamkpa a kpara dịka ha si kọwa n'akara Twitter ha.
Ya bụ otu nwa nne ya mụrụ ji otu afọ efe alanna na Batch B stream 1 dị na Maiduguri, Borno steeti.
Ọ bụkwa enyi Amuta aha ya bụ Success Ezeanya bụ onye zipuru ozi a n'akara Twitter sị na o nwere ndị kpọrọ sị na ha bụ ndị otu Boko Haram kwuru na ha ji Amuta eji.

Ebe foto si, Abraham Amuta/Facebook
Ezeanya rịọrọ n'akara twitter ya sị, "O ruola izuụka abụọ achọwara Abraham Amuta.
"Ndị sị na ha bụ ndị Boko Hara kpọrọ n'ekwentị sị na ọ bụ ha tọọrọ Abraham.
Biko onye ọbụla zisawa ozi a ka o rụọ ndị isi ọchịchị aka". ka o kwuru.
Ka Borno sị dị egwu, a na-enye ndị ji otu afọ efe alanna ohere ị sị na ha agaghị aga ebe ahụ.
Nke a mere ka ihe ruru mmadụ narị asatọ sị na ha agaghị aga ebe ahụ ife alanna ha kemgbe ọnwa Nọvemba gara aga.









