'Onweghị onye chụpụrụ Orji Kalu n'ọrụ' - APC

Uzor Kalu

Ebe foto si, @OrjiUzorKalu01/Facebook

Otu ndọrọndọrọ ọchịchị nke APC dị n'Arọchukwu ekwuola na ụlọikpe ehibere n'Ụmuahia maka mkpesa gbasara ntuliaka achụpụghị Orji Kalu n'oche ya dịka omeiwu nke 'Abia North'.

Ha kwu kwara na ha anabataghị mkpebi ụlọikpe ahụ.

Ha gara n'ihu kwuo na Ọrji Kalu bụ onye ama ama nwetere ntuliaka puku iri atọ, narị abụo na atọ were meria onye nke otu PDP bụ Mao Ohuabunwa nwetere puku iri abụo, narị asatọ na otụ.

Otu APC kwuru na ha ga-eweghachị ikike enyere Ọrji kalu n'ụloikpe mkpesa.

Ma kọwakwaa na ụlọikpe ahu nyere iwu ka emegharịa ntụliaka n'ụfọdụ ọgbọ ntuliaka nke dị na 'Abia North'.

Ha riọkwara ka ndị otu APC niile dere ma hapụ ka ndị ọzọ tinye ha n'ikpa agwa ọjọọ ma kwu kwaa ka ndị PDP na ndi enyi ha kwụsị igbasa ozi asi maka Orji kalu.

N'aka nke ọzo ụlọikpe nyere iwu na Kalu nwereike ịkpeasa ya bụ ikpe mgbe abalị iri itoolu gachara.

Lee akụkọ ga-amasị gị

Lee ihe nkiri ga-amasi gị

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo