Land Dispute: Esemokwu ala ka na-ata isi ndị mmadu n'Ebonyi

Mbara ala

Ebe foto si, Getty Images

Oke igbu mmadụ n'obodo ndị gbara gburugburu n'okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi steeti anaghị atọ ọchị.

Ozu mmadụ asatọ ka e butere n'obodo Ngbo n'ụbọchị Satọdee bụ ndị amabeghi onye maọbụ ndị gburu ha.

Mana ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ bụ Loveth Odah gwara BBC Igbo na a na-eche na ọbụ esemokwu ihe gbasara ala kpatara ọnwụ ndị ahụ.

Odah kwuru na n'ime mmadụ asatọ ahụ e gburu, anọ ka e bepuru isi, ebe ndị ọzọ gụnyere ụmụ otu n'ime ha dị naanị afọ ise.

Aha ndị e bepuru isi bụ: James Aneke onye gbara afọ iri ise na atọ, Innocent Agbo, Chukwu Enwe na Livinus Idoko.

Ndị ọzọ: Ngozi Ibeni, Jonathan Onwe onye gbara afọ iri, Susan gbara afọ ise na otu onye ọzọ.

Otu onye aha ya bụ Nwankwọ ka nọ ọdị ndụ ọnwụ ka mma n'ụlọọgwụ dịka Odah si kwu.

Gini na-akpata oke ogbugbu ndịa?

Akụkọ Igbo

Odah kwuru na enwere otu mpaghara ala a na-azọ n'etiti obodo abụọ, otu bụ ndị Ebonyi Steeti, nke ọzọ bụ ndị Benue steeti.

O kwuru sị: "Mgbe ikpeazụ e gburu mmadụ bụ ndị gara n'ala ahụ a na-azọ azọ ịkọ ugbo."

"Anyị adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ghara ịrụzi ọrụ ugbo n'ala ahụ ganye na ekpezichaa esemokwu."

"Mana nke ugbu a bụ na ndị ahụ gafetere ma bata n'ime obodo gbukpọọ ndị mmadụ."

Odah kwukwara na-amaghị ma ndị ji akụkụ ahụ mmadụ agwọ ọgwụ ọjọọ etinyekwuola aka n'igbu ndị mmadụ n'okirkiri ahụ.

Nke a bụ maka na ụfọ ndị ahụ e gburu egbu, akụkụ ahụ ha ụfọdụ adịghịzi ya.

Olee mgbe okwu ala malitere?

Aha onyonyo, Ebonyi salt lake: Ihe mere ụmụnwoke anaghị aba mmiri a.

Ndị uweojii kwuru na okwu ahụ malitere ọtụtụ afọ gara aga.

Loveth kọwara etu nwanyị obodo Ohaukwu gbarala afọ iri itoolu siri kwuo na ọgụ ahụ malitere tupu amụọ ya.

"Ọ bụ ihe anya mmiri na ihe dị otua ka na-eme n'ọgbara ọhụrụ a a kpọrọ "21st century".

Gịnị ka ndị uweojii na-eme?

Ndị uweojii

Ebe foto si, AFP

Dịka Loveth sị kwuo, Kọmishọna ndị uweojii na Ebonyi steeti bụ Awosola Awotunde agaalarị njem nleta n'ebe ahụ ihe a mere.

Awotunde kwere nkwa na ya na ndị isi na-elekọta mpaghara "zone 4", Larmode Titus, nakwa nke "zone 6", Musa Kimo, ga agbakọ aka wee rụọ ya bụ ọrụ.

Ngalaba "zone 4" nke ndị uweojii gụnyere Benue, Nasarawa nakwa Plateru steeti, ebe "zone 6" gunyere Akwa-ibom, Cross River, Rivers na Ebonyi.

Loveth kọwara na mpaghara a na-azọ azọ buru oke ibu nke mere na naanị ndị uweojii nọ n'Ebonyi steeti agaghị echekwata ya nke ọma.

Ọtụtụ steeti gbara Ebonyị gburgburu nke mere ka okwu ala na-adapụtakarị kwa mgbe kwa mgbe.

Steeti ndị a gụnyere Benue, Cross River, Abia na Enugu.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo