Joel Kachi Benson: Nwaafọ Igbo ejirila akụkọ ụmụakwụkwọ Chibok rite nturuugo na mba ofesi

Ebe foto si, Reuters
Ihe nkiri Joel Kachi Benson mere maka ncheta afọ ise a tọrọla ụmụakwụkwọ Chibok enyela ya nturuugo na mba ofesi.
Ihe nkiri ahụ a kpọrọ "Daughters of Chibok" ritere "akụkọ VR kacha mma" n'ọgbọ nturuugo ndị ihe nkiri e mere n'obodo Venice dị na mba Itali.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 1
Benson gara n'ihu kọwaa etu o si si n'ebe ikpofu ahịhịa bụrụ onye e buliri elu na onye ụwa kpụ n'ọnụ taa.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post, 2
Lee mgbe a ga-eli Mugabe

Ebe foto si, AFP
Ndị mba Zimbabwe ekwuola na a ga-akwa Robert Mugabe bụ aka chịburu mba ahụ n'ụbọchị 14 tupu e lie ya n'ụbọchị 15 nke ọnwa Septemba 2019.
N'akwụkọ ozi ha kesara nye ndị nnọchiteanya ndị mba ọzọ, ha kwuru na a ga-akwa ya dịka e si akwa onye chịburu mba ha nke Bekee kpọrọ "state funeral".
A ga-kara ya ụka e ji akwa ya n'ọgbọegwuregwu dị n'isiobodo Harare.
Omo-Agege bu ụkpa ekele bịa

Ebe foto si, Sen Ovie/ Twitter
Ovie Omo-Agege bụ osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ekeleela ndị Delta sentralụ bụ ndị ọ na-anọchite anya ha nakwa ndị Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
O kelere ha maka ikwado ya dịka ụlọikpe e hibere maka ihe ndapụta na ntuliaka nyere ya mmeri n'oche ya ọ na-azọ.
Trump akagbuola nzukọ ya na Afganịstan
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump akagbuola nzukọ nzuzo ya na onyeisi mba Afghanistan na ndị Taliban kwesịrị inwe gbasara ịkpa etu agha dị n'etiti mba abụọ ahụ kemgbe afọ iri na asatọ ga-esi ebi.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ọ kagburu nzukọ ahụ makana ndị Taliban kwetere na aka ha dị na mwakpo gburu otu onye agha Amerịka nso nso a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu bọolụ nkata Naịjirịa ga-aga Olimpiks 2020!
Ndị otu bọọlụ nkata Naịjirịa awụferela ebe ha ga-eso zọọ asọmpi Olimpiks nke a ga-eme na Tokyo n'afọ 2020.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Naịjirịa meriri Chaịna na mba ha taa, nke mere ka ha zọta naanị otu oche na-eru Afrịka n'asọmpi a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
'Anyi adịla njikere ka anyi na Ipob nwee nzukọ' - Ndị gọvanọ ọwụwa-anyanwụ

Ebe foto si, TWITTER/@GOVDAVIDUMAH
Ndi gọvanọ ọwụwa anyanwu ekwuola na ha enweghị ikike imachị ndi Ipob kama na ọ bụ emume ha ka ha machiri.
Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi kwuru sị na ndị Govanọ ọwụwa anyanwu adịla njikere ka ha na ndị Ipob nwee nzụkọ ka ụdo were chịa na mpaghara ọwụwa anyanwụ.
Umahi kwuru nkea n'ụbochị Tọzde ma si ka ndị Ipob hibe ụbọchi na ebe ọbụla ha chọrọ ka ha na ndị Gọvanọ nwee nzuko na ndị Gọvanọ ga-abia.
Ọ kwukwara na ha na ndị Ipob bụ umunne na ihe kacha mma ugbua bụ ka ha na Ipob nwee nzụkọ.
Nke a na-abịa dịka ndị Ipob degara ndị Gọvanọ ọwụwa anyanwu akwụkwọ n'ụbochi Wenezde ebe ha kwuru ihe ha chọrọ ka gọọmenti mee nke gụnyere iwepụ mmachi amachiri Ipob, ma kwe ka emume gbasara Biafra na-aga n'ihu n'ọwụwa anyanwu niile.
Ngagharị ndị Shia ga-eme n'ụbọchi Tuzde

Ebe foto si, Getty Images
Otu gọọmenti Naijiria machiri amachi bụ Islamic Movement of Nigeria (IMN) eji Shia mara, amaala ndị uweojii aka n'ihu ma kwuo na ha ga-eme ngagharị ncheta ọnwụ Husayn Ibn Ali n'ụbọchi Tuzde na agbanyeghi mmachi amachiri ha kama ya rie isi ha.
Ọnụ na ekwuchitere ndị Shia bụ Ibrahim Musa kwuru na ndị Shia ụwa niile na-eme ngagharị a, na nke ha agaghị apụ iche.
Musa kwuru na ngagharị ha agaghị enwe ọgba aghara ọbụla n'ihi na ụmụ ha na nwunye ha ga-eso.
N'aka nke ọzọ , ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii bụ Frank Mba zahachiri ha ma kwuo na ha nwaa ya ka ha hụ ihe oku ji ntị oke eme.
Xenophobia: 'Onweghị ihe ga-eme ụloọrụ ndị Saụt Afrịka dị na Legos' - Sanwo-Olu

Ebe foto si, OTHER
Gọvanọ Legos Steeti bụ Babajide Sanwo-ọlụ akatọọla mwakpo awakporo ụlọọrụ ụfọdụ ndị mba Saụt Afrịka dị na Legọs.
O kwuru na ọ nyere iwu ka ndị nchekwa niile na Legos mee ihe niile ihu na enwere nchekwa ụloorụ ndi Saụt Afrịka niile dị na Legos.
Akụkọ anyị na Nkeji
N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ kagbuola atụmatụ ikpe udo Amerịka na ndị otu Taliban nwere na Afghanistan dịka ndị otu ahu kwuru na ọ bụ ha tụrụ ogbunigwe gburu otu onyeagha Amerịka n'ụbọchị Tuzde.
Trump Kagbukwara nzụkọ ya na ndị isi Taliban na ọnyeisiala Afghanistan bụ Ashraf Ghani kwesiri inwe n'ụbọchi Sọnde.
N'Egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
Iko 'Grand Slam' nke 'US open 2019' abụrụla Serena Williams ọ nọ nso eru aka dịka Bianca Andreescu nke Kanada gbara afọ 19 meriri ya n'agba nke ikpeazụ nke asọmpi a.
Dika ọ dị ugbua, nke a bụ ụgboro ano a na-emeri Williams n'agba nke ikpeazụ n'iko 'Lawn Tennis.'
Lee akụkọ ga-amasi gị
Lee ihe nkiri ga-amasi gị











