Bianca Andreescu: Nwa dị afọ 19 anarala Serena Williams ụra rahụ

Williams

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Williams adaala na agba ikpeazụ asọmpị anọ

Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu akpọrọ Bianca Andreescu anarala Serena Williams ụra rahụ site n'ịmabụrụ iko US Open nke 2019.

Mmeri a napụrụ Williams ohere ọ kara iji mabuo iko 'Grand Slam' nke iri abụọ na anọ ya.

Iko a bụ 'Grand Slam' nke mbụ Andreescu bụ onye Canada mabuterela kamgbe ọ malitere ịkụ bọọlụ Tenisi.

Bianca

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nke a bụ mbụ Andreescu na-amabute iko 'Grand Slam'

Williams onye dị afọ iri atọ na asaa emenwụghị ọtụtụ ihe Andreescu onye ọbara ya ka na-apụ ọkụ mere n'asọmpị ahụ.

"Afọ a abụrụla nrọ bịara na mmezu," bụ okwu pụrụ n'ọnụ Andreescu mgbe o merichara.

Andreescu onye gosiri obi ụtọ ya nke ukwu kwuru na ọ bụrụ ya nnukwu mbụlịelu na ya na Serena Williams sọkọtara mpi na US Open nke afọ 2019.

Ihe nkiri a ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Awgu Caves: Ọgba ndị a chere ndụ ndị Mmaku n'oge gboo

Akụkọ ndị ga-amasị gị: