Robert Mugabe: Foto na-egosi etu Robert Mugabe si bie ndụ

Robert Mugabe kpọkọtara ndị ntaakụkọ dịka e duchara ya n'iyi ọrụ dịka praịm mịnịsta n'ụbọchị 6 Maachị, n'afọ 1980.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, A họpụtara onye ndụ otu Zimbabwe African National Union (Zanu) bụ Robert Mugabe dịka Praịm Mịnịsta na ngwụcha ọchịchị ndị Briten na Rhodesia (bụzi Zimbabwe ugbua).
Mugabe na ọkparaeze Wales, onye ndu Zimbabwe African People Union (Zapu) bụ Joshua Nkoma na odeakwụkwọ mba Briten bụ Lord Carrigton mgbe ha nọ n'ụlọ gọọmentị dị na Salisbury (Bụ Harare ugbua).

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe bụ naanị onye ndu ndị mba Zimbabwe ma kemgbe ha nweere onwe ha. Mugabe na ọkparaeze Wales, onye ndu Zimbabwe African People Union (Zapu) bụ Joshua Nkoma na odeakwụkwọ mba Briten bụ Lord Carrigton.
Robert Mugabe (aka nri) na Joshua Nkomo dịka ha nọ na Lancaster House, London.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Mugabe pụtara ihe dịka otu n'ime ndị ndu agha 'guerilla' megide ndị ọcha dị obere ịchị ya na Joshua Nkomo mana ha abụọ mechara see okwu.
Margaret Thatcher na Robert Mugabe n'afọ 1980

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe ya na Praịm Mịnịsta Briten bụ Margaret Thatcher n'afọ 1980, mgbe ọ na-achọ ime udo n'etiti ya na ọcha na-arụ ọrụ ugbo ka ha wee dozie akụnaụba ha.
Presentational white space
Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Canaan Banana (n'aka ekpe) na onyeisiala Robert Mugabe n'afọ 1986

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Canaan Banana (no n'aka ekpe) bụ onyeisiala Zimbabwe oge Mugabe bụ Praịm Mịnịsta.
Onyeisiala Zimbabwe bụ Robert Mugabe na nwunye ya Grace mere njem nlereanya na 'Temple of Litterature' dị na Hanoi, n'afọ 2001

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ụfọdụ ndị Zimbabwe sị na ihe bidoro dịwa njọ mgbe Mugabe lụrụ odeakwụkwọ ya bụ Grace n'afọ 1996. Ha abụọ ka ị na-ahụ ebe a mgbe ha gara njem nlereanya na Vietnam n'afọ 2001.
Presentational white space
Onyeisiala mba Amerịka bụ Bill Clinton na-egosi onyeisiala Mugabe ihe ndị ga-amasị ya n'obi ọchịchị 'White House' n'afọ 1995

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, N'afọ 1995 Mugabe zutere onyeisiala mba Amerịka bụ Bill Clinton. N'oge a, akụnaụba mba Zimbabwe akụọla afọ n'ala.
Presentational white space
Tony Blair na onyeisiala mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe na-akpa nkata n'ụbọchị 24, Ọktoba afọ 1997 n'Edinburgh, tupu nzuko 'Commonwealth' ndị isi mba dị iche iche.

Ebe foto si, PA

Nkọwa foto, Mugabe tụgharịrị uche n'agha guerrilla, na-ata ndị ọcha bụ ndị Zimbabwe na ndị mba Briten chiburu ha ụta maka nsogbu ya.
Robert Mugabe na-ekele ndị nkwado Zanu PF dịka ha rutere na mgbakọ na Mutare dị n'akụkụ Harare, n'ụbọchị 9 ọnwa Juun afọ 2000

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Site n'afọ 2000 gawa n'ihu, ndị bụbu ndịagha guerrilla gbakọtara n'azụ onyeisi ha wee sonyezie n'otu ndị agha mba ahụ.
Ndị agha ochie ruru 150 wakporo ọrụ ugbo ndị a n'abalị na ndịda n'ụbọchị 24, Epụrelu afọ 2000. Mebie anwụrụ ndị a kụrụ akụ, chọrọ ịgba ndị ọrụ ọkụ na ndụ, kụọ ha ihe ma chụpụ ha n'ụlọ ha.

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ha wapkoro ndị na-ama ọchịchị aka n'ihu ma kpachie ọtụtụ ọrụ ugbo bụ nke ndị ọcha nwe.
Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe n'afọ 2003

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, E gburu ihe karịrị mmadụ 100 n'ọgbaaghara dara na ndọrọndọrọ ọchịchị nke wepuru Mugabe n'ọkwa mana ọ na-eme mkpesa na ndị ọcha na-achọ ịchutu ya n'ọkwa.
Robert Mugabe na-ekwu okwu n'ofufe ụka na Bulawayo n'ụbọchị 3 ọnwa Maachị, afọ 2008

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka onye ụka Katọlik katara ahụ, Mugabe kwuru na a zala ekpere ya site n'imeri 'ndị iro' ya nakwa mkpachị ọtụtụ ala ndị ọcha nwe.
Onye Zimbabwe na-egosi akwụkwọ ya maka ntuliaka onyeisiala na Harare n'ụbọchị 27 Juun, afọ 2008.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka akụnaụba mba Zimbabwe dakpọrọ n'afọ 2000, e buru amụma banyere ọdịda Mugabe ọtụtụ oge. N'afọ 2008, ọdịnihu edochaghị anya dịka ndị Zimbabwe na-aga ime ntuliaka onyeisiala
Onye ndu otu na-anọghị n'ọchịchị na Zimbabwean bụ Morgan Tsvangirai rutere n'ụlọọgwụ ị nara ọgwụgwọ n'ihi ahụ o merụrụ n'ọgbaaghara dapụtara na ngaharịiwe megide gọọmentị n'afọ 2007.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka ọ dachara inwete vootu ka a ghara imegharị ntuliaka ya na Morgan Tsvangirai, Mugabe ṅụrụ iyi na ọbụ naanị Chineke nwere ike ichutu ya n'ọkwa. N'ihi oke ọgbaaghara na-eso nke a mere ka Tsvangirai ji sepụ aka n'ịzọ ọkwa ahụ.
Robert Mugabe na Morgan Tsvangirai kwere n'aka.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Dịka ọdịda akụnaụba ha gara n'ihu, Mugabe kwetere ike ọchịchị ya nye onye na-ama ya aka mechara bụrụ praịm mịnịsta.
Robert Mugabe dịka o kwuchara okwu n'ọgbakọ United Nations n'ụbọchị 22 September, afọ 2011 n'obodo New York.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Agbanyeghi na amụma e buru maka ọdịda Mugabe amịtaghị mkpụrụ, ọkụ a na-akwa ya pụtakwara ihe. N'afọ 2011, otu ụlọọrụ ntaakụkọ n'Amerịka dere akụkọ kwuo na ọ na-arịa 'prostrate cancer'.
Onyeisiala mba Zimbabwe bụ Robert Mugabe n'ọgbakọ ndị isi mba Afrịka n'ụbọchị 21 Febụwarị, afọ 2003 na Paris, mba Fransị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, "Anwụọla m ọtụtụ oge - ebe ahụ ka m meriri Christ. Christ nwụrụ otu mgbe ma bilie otu mgbe", o kwuru n'ụbọchị ncheta ọmụmụ ya nke afọ iri asatọ na asatọ.
Robert Mugabe, n'afọ 1976

Ebe foto si, Keystone / Getty Images

Nkọwa foto, Robert Mugabe, 1924 - 2019
Presentational white space

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya