Lilian Esoro sị na akụkọ na ọ dịrị Blossom Chukwujekwu ime na-atọ ọchị

Blossom Chukwujekwu na Lilian Esoro

Ebe foto si, Instagram/BlossomChukwujekwu/LilianEsoro

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Lilian Esoro bụ onye e ji ime ejije na Nollywood mara sị na o nweghị ihe ọbụla o nwere ikwu maka ebubo ịnara mmadụ di ya e boro ya.

Onye mbiputa akụkọ bụ Stella DimokoKorkus dere sị na Esoro dị ime nwa onye ejije ibe ya bụ Blossom Chukwujekwu.

Mana esoro gwara BBC Igbo n'ekwentị sị na ọ gaghị ekwu "pịm" maka okwu ahụ makana e nweghi okwu dị ya.

Kama n'elu ihe a na-akpọ "Instagram story" ya na soshal midia, o dere sị "e kelekwaa m unu" ma na-achị ezigbo ọchị.

Ihe Lilian Esoro dere

Ebe foto si, Chimamaka Ihenacho

Nkọwa foto, O dere nke a ka akụkọ na-efegharị na ọ dị ime

N'otu aka ahụ, BBC Igbo gbalịrị inweta Chukwujekwu n'ekwentị nke ya mana o bulighị ya, mana o tinyere foto ebe ọ na-achị ezigbo ọchị n'elu Instagram ya ka aha ya na-efegharị.

Blossom Chukwujekwu

Ebe foto si, Instagram/Blossom Chukwujekwu

Nkọwa foto, O dere na foto ya sị na " Ana m" wee tinye foto ebe ọ na-achị ọchị

Kedụ ihe butere akụkọ a?

Dimokokorkus e ji 'SDK 'mara dere akụkọ na Chukwujekwu akwarala ngwongwo ya si n'ụlọ ya na nwunye ya bi kemgbe afọ 2016 ha lụrụ, kwapụ.

O kwuru na nke a mere makana Esoro dị ime nwa ya.

Ihe Stella dere

Ebe foto si, Instagram/Officialstelladimokokorkus

Okwu si n'ime ya pụta:

Ndị mmadụ malitere ịkpa maka Esoro na Chukwujekwu makana ha bụ ndị na-ewu ewu.

Aha ha malitere iwu n'elu Twitter, ebe ụfọdụ na-ekwu na ọ pụtara na Esoro nwere obi ime nwaanyị ibe ya ụdịrị ihe ya na onwe ya gabigara oge ọ lụburu Ubi Franklin.

@barbie_juliet04 kwuru na o che na enweghi ihe ga-esenwu okwu n'etiti Chukwujekwu na Maureen nwunye ya.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

@ehte_ na-ajụ etu Esoro si hapụ di ya maka ụdịrị ihe a wee soro di mmadụ.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

@tascaramel2 kwuru sị na ebe ọ bụ na Esoro nwere obi ime nwaanyị ihe a, na ọ maghịzị anya ọ ga-eji na-ele ndị mmadụ.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Akụkọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ndụmọdụ Charly Boy maka alụm di na nwunye