Robert Mugabe bụ oke osisi n'Afrika' - Emeka Anyaoku

Aha onyonyo, Robert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dịka anya mmiri juru mba Zimbabwe na mba Afrịka anya taa maka ọnwụ Robert Mugabe, onye Igbo ji aga mba bụ Emeka Anyaoku ebela akwa maka ya bụ oke osisi mba Afrịka dara n'ụtụtụ Frịde.

Anyaoku sị "na-ekwesiri ịcheta Mugabe dịka oke osisi mịrị ezi mkpụrụ na mba ya bụ Zimbabwe, agbanyeghị na osisi ya malitere ịmị ajo mkpụrụ n'ikpeazu".

Anyoku sị na ya matara Mugabe mgbe ọ nọ n'isi ọgụ nnwereonwe mba Zimbabwe n'aka ndị ọcha mgbe mba ahụ na-aza Rhodesia na 1980.

Okwuru na Mugabe ebughị ajo ihe n'obi mgbe ọ napatara obodo ya n'aka ndị ọcha, mana na ọtụghị anya ihe pụtara na ya bụ okwụ.

Onyeisiala Zimbabwe bụ Robert Mugabe

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Robert Mugabe 1924 - 2019

Nke a mere Anyoku jiri dọọ ndị ọchịchị mba Afrịka aka na ntị sị ka ụzụ ga-akpụ ogene lee ya bụ egbe anya n'ọdụ ọkachasị n'okwu gbasara ala gbasara ndị ọcha.

Ọ dọsiri aka na nti ike si atụrụ ga-epu mpi, ekwo kakwaa ya aka.

Grace Mugabe

Ebe foto si, JEKESAI NJIKIZANA

Nkọwa foto, A maghị ma a ga-anwuchị Grace Mugabe

O kwukwara na n'ezie na Mugabe malitere ọchịchị ya nke ọma na 1980, mana na ọ bịaziri wee ka onye nwenụ ma.

Ọ sị na ọbụrụ na Mugabe pụrụ mgbe ekwụ ka dị ọkụ, na ihe mere ya agaghị eme ya.

Ọ sịkwa na oke ọchịchọ nwụnye ya bụ Grace Mugabe, dịka ọ nụrụ, so gbachapụ ya ọkpa n'ala.

Anyoku bụbu odeakwụkwọ ukwụ nke ọgbakọ "Commonwealth of Nations" kwuru na agbanyeghị na a sị na nwunye ya nwere aka na ọdịda ya, mana ya ga-echeta Mugabe dịka dike maliri ka agụ, ma wụọ chọm n'ala ka nwa awọ.

Ihe ndị ọchịchị ndị ọzọ kwuru

Joseph Kabila sị na agaghị echefu Mugabe echefu n'ihi na ọ bụ onye gbataara ha ọsọ enyemaka mgbe ha na Bekee na-alụ.

Ọ sị na mba Afrịka etufuola dike n'agha nnwereonwe.

Emeka Anyaoku

N'otu aka ahụ kwa, Onyeisiala mba Kenya bụ Uhuru Kenyetta enyelarị iwu ka gọọmentị ha tọtuo ọkọlọtọ ha mkpirisi maka iru uju n'ọnwụ Mugabe.

Raila Odinga bụ onyeisi patị anọghị n'ọchịchị na Kenya hụtara Mugabe dịka dike zọpụtara ndị mba ha ma zohiekwa ụkwụ dịka ndị ọzọ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mana ọnụ na-ekwuru gọọmentị Briten kọwara Mugabe dịka ọgbatauhie dịịrị ọtụtụ mmadụ.

O kwuru na ọnwụ ya ga-ebute mgbanwe na ndụ ndị dị otu a.

Onyeisiala mba Rọshịa bụ Vladimir Putin toro Mugabe dịka dike zọpụtara obodo ya n'aka ọchịchị nchigbu.

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Robert Mugabe: Ihe ndị i kwesiri ịma maka ya

Akụkọ ga-amasị gị