Women in marriage: Ihe mere ụmụnwaanyị ji akwado di ha ma e bo ha ebubo

Ebe foto si, Biodun Fatoyinbo,Apst Johnson Suleman Getty Images
Dị ka ndị Bekee si ekwu " nwoke na-eme nkeọma nwere nwanyi na-akwado ya "
Mana n'aka nke ọzọ, nwoke na-eme ihe dị njọ ma ọ bụ eboro ebubo dị njọ, umunwaanyị ha na-akwadokwa ha.

Ebe foto si, Getty Images
Ị ga-ahụta atụmaatụ gbasara nkea dịka mgbe eboro pastor Suleman ebubo ma nke mere nsonso a dịka ọ na-akpọtụ na COZA maka Pastor Biodun Fatoyinbo
Nkea gbara ụfọdụ mmadụ gharii nke mere ka BBC zọpụ njem imata ihe kpatara nkea.
Anyi jụrụ ndị ọkammụta n'ihe gbasara ezinụlọ ka ha kọwara anyị nkea.
Guo ihe ha nwere ikwu :
Oriaku Ifeoma Nnadozie -" Umunwanyi dị ka ulọ, ha na ekpuchite ọtutu ihe."
Nnadozie kwuru na dịka akwụkwọ nsọ siri kwuo, umunwaanyi dị ka ụlọ maka na ha nwere ndidi, ma nwee olileanya na otu ọbụla ọdị na ọ ga adị nma.
Umunwanyị na-anyịdo ihe, ya mere eji kpọo ha 'Nwa-anyị' maka na ha na-edi ihe.
Kama, nwaanyị na-ekpuchi dị ya ebe ọ na-eme ihe dị njọ ga-enwe ntaramahụhụ.
Chidi Lemchị -" Ihe gbasara alụm dina nwaanyị bụ ma ọ dị nma ma ọ dị njọ."
"Alụm di na nwaanyị bụ ma ọ dị nma ma ọ dị njọ, a ga m akwado gi."
Nwaanyị anaghị akwado ihe ọjọọ ma ọ bụ ebubo ọjọọ eboro dị ya kama ọ na-akwado onye ọ lụrụ.
Mgbe nwaanyị kwadoro di ya ma soro ya eme mpụ, nkea abughịzị alum di na nwaanyi, nke ahụ bụ zi azumahịa.









