Ipob arrest: Anwụchiela 140 na Nsukka
Anwụchiri ndị Ipob 140

Ebe foto si, Getty Images
Onye okaikpe Nnamdi Kanu bụ Paul Achara ekwuola na ọtụtụ ndị mmadụ ndị uweojii jidere na Nsukka ụnyahụ abụghị ndị otu Ipob, kama ndị na-agara onwe ha.
Achara kwuru nke a mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka taa.
E boro mmadụ otu narị na iri anọ a ebubu ịkpa nkata ha chọrọ iji chutuo Govementi Naịjirịa n'ike.
Mmadụ 140 juru ebubo a si kwa na aka ha dị ocha.
Otu onye ọkaikpe na-anọchite ha bụ Mazi Okeke kwuru na ebubo a erijughị afọ, kwuo kwa na mmadu 140 a na-aga akwa onye nwụrụ anwụ mgbe a nwuchiri ha.
Okaikpe a gwakwara ndị ọkaikpe n'ekwuchitere ọnụ mmadu 140 a ka ha tinye akwụkwọ n'ụlọ ikpe ma kwụsịe ike na ya bụ ikpe.
Ka ọ si dị, ndị a ga-anọ na mkpọrọ ndị uweojii ruo mgbe akpụpụru ha ụlọikpe.
O kwukwara na ndị eji eji n'aha Ipob akarịala puku abụo (2000) na Naịjirịa.
Ụlọikpe akwụsịla Lalong ịkwepụta ọche eze ọzọ na Plateau

Ebe foto si, Uche Akolisa
Dika ọ dizi ka omenala gọmenti imegharị oche eze na ọchịchị ọdịnala ndị obodo, ụlọikpe na Plateau steeti akwụsịla gọment steeti ahụ ịkpa aka n'oche eze ọdịnala ndị be ha.
Ọkaikpe Christine Dabup kwuru na iwu a bụ maka iji kwụsị alo gọvanọ Simon Lalong ikewapụta oche ọdịnala abụọ ọzọ na steeti ahụ.
Ndị uweojii wụchiri udele a

Ebe foto si, Arterra
Ndị uweojii n'Adamawa kwuru na ha emefuola ihe ruru puku naira iri atọ ịnye otu nnụnụ ha nwụchiri nri.
Ha nwuchiri nnụnụ ahụ na onye nwe ya na Maiha dị na steeti ahụ.
Ha kwuru na ha na-eme nyocha etu o si maputa na ebe ahụ bo ya ebubo na ya na ndị Boko Haram na-arụ kọ ọrụ
Mana ngalaba na-ahụ maka nchekwa mbara na anụmanụ na-akpọ oku si tọghapụ nnụnụ ahụ.
Theresa May akwaala arịrị maka Brexit

Anya mmiri dapụrụ Theresa May bụ Praim Minista mba Briten n'anya ka ọ na-ekwu maka nritu ya.
May kwuru na ọ ga-arịtụ n'ọkwa n'ụbọchị asaa nke ọnwa Juun.
May pụtara n'igwe onyonyo na BBC ebe o nyere obere okwu na ọ ga-arịtu ma kwuo na otu ihe o ji ata ikikere eze bụ na o nwetanwughi Brexit.
Ihe ọ pụtara bụ na ọ ga-akwụsịkwa ịbụ onye ndu otu ndọrọndọrọ a kpọrọ 'Conservatives' n'ala Britein.
Arsene Wenger sị na ya ga-alọhachite azụ n'egwu bọọlụ

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, onye bụbụ onyeisi ndị Arsenal bụ Arsene Wenger awụchiela ọzọ na ọba akụkọ ebe ọ na-ekwụ na ya bụ agaracha "must come back" n'egwu bọlụ.
Wenger kwuru na n'ezie na ya chọbụrụ ezumike mana ugbua ụwa gbala ya gharị nke bụ na ọ gụwala ya ịlọhachị azụ n'egwu bọlụ.
Gee nkeji Igbo
Ndị CAN agbarụọla ihu maka 'Fulani Radio'

Ebe foto si, Canng.org/AFP
Ụmụ Naịjirịa agbarụọla ihu ebe ngalaba jịkọrọ ndị nkuzi Mahadum bụ ASUU nọ dịka ha gwara ndị mmadụ atana ha ụta ma ha gbaa abụbọ ọrụ ọzọ
Biodun Ogunyemi bụ oneyisi ha gwara BBC n'ekwentị na ọ bụ iji gwa oha niile na gọọmentị etiti emezubeghi nkwa ekwere ha.
Onye mere ndị nkuzi Mahadum?

Otu Christian association of Nigeria bụ CAN n'aha ịchafụ akatọọla atụmatụ gọọmentị Naịjirịa maka igwe mgbasa ozi nke ndị ọchịehi Fulani ha na-achọ ịgbape
CAN hụrụ ya dị ka ngba okpuru gọọmenti Naịjirịa chọrọ iji mee ka Naịjirịa ghọrọ mba alakụba, mana ndi otu alakụba bụ "jama'atu Nasril Islam" kwuru na ọ bụ maka mgbasa ozi na ọmụmụ ndị ọchịehi Fulani.
Iwu ọhụrụ amalitela na Taiwan

Ebe foto si, Getty Images
Na mba ofesi mba Taiwan abụrụla mba mbụ n'ala Eshia ịnye iwu ga-eme ka nwoke na nwoke nakwa nwaanyị na nwaanyị nweta ikike ịlụ onwe ha.
Iwu ahụ a manyere ga-ebido ọrụ n'ụbọchị Fraide na be ha.
Facebook abanyela egwu 'Cryptocurrency'

Ebe foto si, Getty Images
Facebook ekwuola na ha ga ewepụta "Cryptocurrency" nke ha a na-akpọ 'Globalcoin' na afọ 2020.
Ha kwuru na nke a ga enyere mmadu niile aka ikwụ ugwọ ihe ọbụla n'igwe intaneti na agbanyehị ego obodo ha maọbụ ebe ha nọ.
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Reuters
Akpọọla Kelechi Iheanacho na Isaac Success esoro la na ndị ọgbaa bọọlu na premiership kachaa etufu oghere iji nye goolu.
Nke a putara ihe mgbe agụkọrọ golu ha nyere na asọmpi premiership nke afọ gara aga.











