Benue-Ebonyi land dispute: Wepụtanụ ndị gburu ndị Ebonyị anọ maọbụ... - Ortom

Samuel Ortom

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Samuel Ortom gọvanọ Benue steeti

Gọvanọ Samuel Ortom enyela Eze obodo na ndị bi n'okpuru ọchịchị Ado nke nọ n'agbata Benue na Ebonyi steeti abalị asaa ka ha kpọpụta ndị aka ha dị n'ogbugbu mmadụ anọ ndị Ebonyi steeti.

Ọ kwuru na ọ bụrụ na emeghị otu a, na gọọmentị ya ga-achụtu eze okpuru ọchịchị Agila n'ọkwa n'ike.

Na nso nso a, e gburu mmadụ anọ ndị Ebonyị so na kọmịti udo nke steeti abụọ ahụ hiwere maka ịkpa udo n' okwu esemokwu ala dị n'etiti ọkpụrụ ọchịchị abụọ dị na steeti abụọ ahụ ka ha na-aga Makurdi

maka ọgbakọ ịkpa udo.

Na mkparịtaụka BBC Igbo na ọnụ na-ekwuru gọọmenti Benue bụ Terve Akase nwere n'ekwenti, ọ kọwara "Gọọmenti Benue na Ebonyi gbakọtara ọnụ n'Abakaliki were hiwe kọmịtị maka ịkpa udo.

Ka e mechara ọgbakọ nke Abakaliki, e kwesịrị ime ọgbakọ ọzọ na Makurdị. Ọ bụ oge ndị so na kọmịti ahụ na-abịa Markurdi ka ndị a na-enyọ na ha bụ ndị na-akwado ndị Benue chere ha n'ụzọ,gbupụ ha isi."

"Mgbe Gọvernor Benue bụ Samuel Ortom nụrụ nke a, o nyere iwu ka Eze obodo Agila kwado ndị uweojii ka akpopụta ndị kpara mkpamkpa ahụ."

Mgbe BBC jụrụ ya ihe a ga-eme ndị ahụ ma enweta ha, ọ kwuru na dịka iwu Naijria siri kwu na aga enyefe n''aka ndị uweojii ka akpụpụ ha ụlọikpe ịzara ọnụ ha.

N'aka nke ọzọ o kwuru na onye eze ọbụla zoro ndị omekome na aga achụtu ya n'ọrụ n'ike.

Akụkọ ga-amasị gị: