Benue: ọchịehị egbuola ndị mmadụ ọzọ?

Ndị uweojii na Benue

Ebe foto si, Nigeria Police Force

Nkọwa foto, Onyeisi ndị uweojii na Benue, Fatai Owoseni

Ndị uweojii na Benue ekwuola na ndị omekome ataala isi ihe ruru mmadụ asaa (7) ma merukwa mmadụ isii (6) ndị ọzọ ahụ na Tse Adough dị na okpuru ọchịchị Kwande n'ụtụtụ ụbọchị ụka.

Ndị uweojii kwuputara nke a n'akwụkwọ ha biputara ndị ntaakụkọ ebe ha kwuru na ndị omekaome a gbakwara ọtụtụ ụlọ ọkụ.

Ha sịkwa na-achọtala nwa nwaanyị ahụ nke a na-eche ndị mmgbuisi a tọrọ.

Ha sịkwa na "ha na-agba mbọ ihụ na ha jidere ndị mere mpụ a ebe ha gbara mbọ iweta ezi nchekwa na obodo ihe ndị a metutere.

Akwụkwọ ntaakụkọ a kwukwara n'ọtụ nwoke ji obere ihe gbalahụ ọnwụ bụ onye sị na ha nọ n'ụra mgbe ndị omekome a wakporo ha n'isi ụtụtụ ụnyahụ na-agbaghị ama ọbụla.

Onye ọchị ehi

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Gọọmentị agbọbeghị ndị ọchịehi otu iyi egwu

Onyeisi okpuruochịchị ime obodo bụ Terdoo Nyor Kenti bere arịarị na a n'egbu ndị be ha na-emeghị nta na-emeghị imo.

Ọkwukwara n'ahụrụ ozu ndị mmadụ ruru asaa ma merukwa isii ahụ.

Ndị uweojii Benue kwukwara n'otu isi ụtụtụ ahụ mkpamkpa hụ kpara na ndị otu nzuzo abụọ kpọrọ onwe ha Black Skin na Red Skin gwọrọ onwe ha ji mmanu ụbọchị ahụ ebe isi mmadụ abụọ nara ma otu onye meruru ahụ.

Ndị uweojii sị na-ama agbara ha mere eji jide mmadụ iri na ise (15) ebe mmadụ asaa (7) n'ime ha bụ ndị otu nzuzo a.

Ha kelekwara ndị obodo marịọkwa ka ha tinye aka n'ịgba ama maka ndị ọjọọ nakwa agwa rụrụ arụ. "Ọhụrụ kwuo", dịka ha sị tinye ya.

Akụkọ ga-amasị gị: