Abia Poly sack: "Gọọmenti chọrọ ikpuchi nchọpụta ndị omeiwu mere" - Cmdr. Nwachukwu Chukwu

Abia Poly

Ebe foto si, Christian Onyeagha/Abia Poly

Comrade Nwachukwu Chukwu bụ onyeisioche ndị otu Senior Staff Association nke Politekinik Abia steeti ekwuola na obi adighị ndị ọrụ mma maka ọchụchụ mberede gọọmenti chụrụ ndị ọrụ ha.

Chukwu onye kwuru nke a na mkparịtaụka ya na BBC sị na gọọmenti chọrọ ịchụ ndị ọrụ eji ụgwọ ọnwa iri na isii.

Ọ sị na ha nọ na ụbọchị Wenezde mgbe ndị uweojii dị iri na atọ (13) bucha egbe batara ụlọakwụkwọ iyi ndị mmadụ egwụ.

Mgbe ha gara ịjụ ndị isiụlọakwụkwọ ihe mere ndị uweojii jiri kpojuo ụlọakwụkwọ ha, ndị isi gwara ha na onwere ndị achọrọ ichụ n'ọrụ.

Chukwu kwuru na onwere ihe gọọmenti na-ekpuchi nke mere ha ji bia ịwakpo ụlọakwụkwọ ahụ tupu nchọpụta ndị ụlọomeiwu mere apụta.

Ọ sị na ndị ụlọomeiwu nọ ọrụ nchọpụta n'Abia Poly kemgbe ọnwa Julaị afọ a mana gọọmenti echeghị ka nchọpụta ha pụta ihe.

N'uche ya, kọmitii ndị omeiwu chọpụtara ọtụtụ ihe mkpughe nke gọọmenti achọghị ka ọ pụta ihe.

Ugbua, ndị ọrụ niile n'Abia Poly gbara ọsọ ndụ ka ndị uweojii ghara ịmeru ha ahụ, dịka Nwachukwu si kwuo.

Ọ sị na 'ndị isi otu anyị nọ n'ọsọ ndụ maka egwụ a na-eyi ha".

Ọ sịkwa na ha na-agagharị ịkpesara ndị otu ha dị icheiche dịka ndị "Nigeria Labou Congress" ka ha gbatara ha ọsọ enwemaka ma gbaziere ha ụzọ otu ha ga-esi mee ka gọọmenti gee ha nti.

Comrade Nwachukwu Chukwu

Ebe foto si, Nwachukwu Chuks

Nkọwa foto, Comrade Nwachukwu Chukwubụ onyeisi otu ndị ọrụ Abia Poly

Chukwu kwuru na ọnweghị ihe dị njọ ịchụ ndị ọrụ mgbe gọọmenti chọpụtara na ha agaghị akwuli ha ụgwọ, kama na ekwesiri ịkpa ya akpa.

Ọ sị na ọbụghị maka asambodo adigboroja ka e ji chụọ ndị ahụ n'ọrụ maka na oteelarị achụchara ndị ji asambodo adịgboroja nke ụfọdụ n'ime ha bụ ndị e mechara kpọhachite azụ.

Mana onyeisi ọrụ nta akụkọ gọvanọ Abịa steeti bụ Onyebuchi Ememanka gwara BBC na ya bụ oke mmiri ruwere kemgbe 2015.

Ememenka kwuru na ndị na-arụ ọrụ na ya bụ ụlọakwụkwọ kariri ego ha na-arụta.

Dịka o si kwuo, "naanị ndị nche na-arụ n'ụlọakwụkwọ karịrị iri asatọ (80)".

Ọzọ bụ na ọtụtụ mmadụ na arụ ebe ahụ ji asambodo na-abụghị ndị ọma ya.

Ya kpatara gọọmenti ji hibe kọmitii lebere anya na ọrịa ji ya bụ ụlọakwụkwọ nke mere na ha enweghị ike ikwuli ụgwọ ọnwa ndị ọrụ ha.

Onyebuchi Ememanka

Ebe foto si, Onyebuchi Ememanka

Nkọwa foto, Onyebuchi Ememanka - Onyeisi ọrụ nta akụkọ gọvanọ Abia steeti

Agbanyeghị ego mmachi akpa gọọmenti na-enye ha, ụlọakwụkwọ ji ụgwọ toruru ijere naịra abụọ bụ nke Ememanka gwuru na gọọmenti steeti ahụ kwuchapụrụ na 2015.

Ya kpatara ya bụ kọmiti ji sị ka a chụọ ndị a niile iji mee ka ya bụ ụlọakwụkwọ kurutu ume ndụ ma kowekwa akpa ya ebe aka ya ruru.

Nke a butere ịchụ mmadụ ruru nari abụọ na ụma iri ise na asatọ n'ọrụ.

Ememanke kwuru na gọọmenti kwere nkwa ịkwụchapụ ha ụgwọ e ji ha agbanyeghị na-ekwesiri ịtụ ha mkpọro maka asamodo adigboroja ha ji bata.

Akụkọ ga-amsị gị

Aha onyonyo, Robert Mugabe: 'Ọ bụ oke osisi n'Afrika' - Okwu Emeka Anyaoku na ndi ọzọ