Eastern Palm University: Okorocha agbarụọla ihu maka ije gọọmentị Imo na mahadum ya

Ebe foto si, www.epu.edu.ng
Owelle Rochas Okorocha bụ aka chịbụrụ Imo steeti agbarụọla ihu maka akụkọ na gọọmentị Imo steeti naghara ya mahadum 'Eastern Palm University.'
Okorocha ji ohere ozi o zipụtere rịọ ka gọọmentị chee echiche ọfụma tupu ha zọpụ ije gbasara mahadum ahụ.
Ebere Nzewuji bụ onye nnyemaka mgbasaozi Okorocha kwuru na gọọmentị Imo steeti emeghị ọfụma chaa chaa.
Ọ sịrị,"Gọọmentị Imo kwesiri ịnyocha mahadum ndị ahụ tupu ha amachie ya"
Okwu a na-abịa dịka kọmitii nke Emeka Ihedioha kpokọbara mak iwetakwa ihe gọọmenti furu efu kwuru na e kwesiri inyeghachi mahadum ahụ n'aka gọọmentị
Ha kwuru na o doro anya na ọ bụ ego gọọmentị ka eji rụọ ya bụ mahadum Eastern Palm University mbụ n'ihi na ọ bụ gọọmentị Imo zụrụ ala ebe a rụrụ ya.
Ọnụ na-ekwuchitere Emeka Ihedioha bụ Steve Osuji gwara BBC Igbo na o nwebeghi ihe gọọmentị mere maka nchọpụta a.
O kwuru na kọmiti ahụ lebara anya na mahadum na politeknik niile Okorocha hibere tupu ọ pụọ n'ọchịchị.
N'ọnụ ya "Gọọmentị ka natara mpụtara Kọmitii ahụ nyere ụnyaahụ, o nwebeghi ihe ha kwuru maọbụ mee gbasara ya."








