Rochas Okorocha : E meela ngaghariwe maka atụmatụ ibupụ Imo State Polytechnic

Ndí na-eme ngagharíiwe

Agụmakwụkwọ akwụsịtula n'ụlọakwụkwọ dị elu bụ ImoState Polytechnic dị n'Ụmụagwo, nke dị n'Okpuru ọchịchị Ohaji/Egbema.

Nke a bịara dịka ndị obodo ahụ mechara ngagharịiwe na gburugburu ụlọakwụkwọ ahụ n'ụbọchị Monde iji gosipụta iwe gbasara atụmatụ gọọmenti Imo ibupu ụlọakwụkwọ ahụ ebe ọ dị.

Ndị na-eme ngagharịiwe gbochiri ebe e si abanye n'ime ụlọakwụkwọ ahụ gbochie ụmụakwụkwọ nakwa ndị ọrụ ụlọakwụkwọ ahụ ịpụ maọbụ bata.

E gbochiri mmadú ípú maóbú bata n'úlóakwúkwó ahú

Cheta na gọọmenti steeti ahụ mere politeknik ahụ mahadum aha ya bụzị University of Agriculture and Environmental Sciences.

Ha natakwara nkwado nke ngalaba gọọmenti etiti na-ahụ maka mahadum bụ National University Commission.

Gọọmenti steeti gara n'ihu buga mahadum n'ọnọdụ ọhụrụ n'Okpuru ọchịchị Ehime Mbanọ.

Ndị na-eme ngagharịiwe n'ihu ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Uche Akolisa

Gọọmenti chọrọ ime ụlọakwụkwọ ahụ ka ọ bụrụzie Imo State University of Agriculture and Environmental Sciences.

Ndị na-eme ngaghariiwe

Mana ụfọdụ ndị mmadụ ekwenyeghị na nke a nke mere na ha malịtere ịme ngagharịiwe n'ụbọchị Monde.