School fees: Obodo eji ọkụkọ, ewu na atụrụ akwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images
Minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ n'obodo Zimbabwe bụ Lazarus Dokora bụ onye mere ka maata nke a.
Ọ gwara ndị ntaakụkọ Sunday Mail Newspaper na ụlọakwụkwọ ga-anabata ndị na-enweghi ego ịkwụ ụgwọ ụlọakwụkwọ ha n'oge.
Ọ kwukwara na ọ bụghị naanị anụmanụ dị ndụ ka ha na-ana, mana ha na-anabata ndị nwere aka ọrụ.
"Ọ bụrụ na ha nwere ndị na-enye aka ịrụ ụlọ n'obodo, ha ga-enyere ha ohere i ji aka ọrụ ahụ wee rụpụta ụgwọ ụlọakwụkwọ ha," dịka ndị ntaakụkọ jiri kọwa.
Ụfọdụ n'ime ụlọakwụkwọ ebidola ịnabata anụmanụ ndụ dịka ụgwọ ụlọakwụkwọ dịka Sunday Mail kwuru.

Ebe foto si, Getty Images
Onye na-arụ na ministri kọwatụrụ na okwu Dọkịta Dokora na "Ndị nne na nna ya bụ ụmụ ụlọakwụkwọ nwereike ịkwụ ụgwọ site n'iji anụmanụ ndụ-
Ya bụ maka ndị bi n'ime obodo, mana ndị nne na nna ndị ụmụakwụkwọ bị na mba nwereike iji aka ọrụ wee kwụọ ụgwọ ụlọakwụkwọ."
Iwu a sonyere aka ndị Zimbabwe kwere ka ndị mmadụ na-eji anụmanụ ndụ, dịka ewu, ehi, na atụrụ, ji wee kwụọ ụgwọ na mbite.
N'ime iwu ndị ụlọ omeiwu ha wulitere n'izu a, a nabatara ka ndị mbite tinye aka n'ime akụnaụba ha nwere dị mfe gụnyere ụgbọala, igwe, dgz ji manye maka mbite dịka mpaghara ndị ntaakụkọ BBC World na-eleba anya na azụmaahịa kwuru.
Dịka ụlọ ntaakụkọ Bulawayo24 siri kwuo, ego na-adịghị na mba Zimbabawe na-eme ka ndị mmadụ mefuo oge n'ụlọakụ.
Gọọmentị siri na ọ bụ maka na ndị mmadụ na-ebupu ego na mba ndị ọzọ.
Mana ụfọdụ ndị mmadụ ekwenyeghị n'okwu ha, ha kwuru na ọ bụ maka ọrụ na mwụlite adịghị n'obodo.










