Parrot arrested : Anụmanụ atọ ndị ga -abara gị uru n'ụzọ ị tụghị anya

Ebe foto si, BBC/AmakaUmeh
Ewezụga ị bụ ihe oriri nakwa ihe na-enyere mmadụ aka n'ọrụ, anụmanụ ụfọdụ bara mmadụ uru n'ụzọ pụrụ
Lee anụ enunu atọ na nnyere mmadụ aka n'ihe ha na-emere ndị nwe ha.
Icheku

Icheoku bụ nnụnụ na-efe n'elu mana ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-akpa ya n'ụlọ dịka enunu.
Ọ na-enwe ọnụ gbakọrọ agbakọ, na-enwekwa agwa dị iche iche mana ọtụtụ ha na-acha akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ maọbụ aja aja.
Icheoku so na nnụnụ nwere oke amamihe. A makwa ya dịka nnụnụ na-ejije mmadụ. nke mere ọtụtụ ji enwe mmasị na ya.
Ihe mere icheoku anụmanụ pụrụ iche bụ n'ọ bụ ọgba ama. I hapụya n'ụlọ ọga-akọọ gị ihe mere n'ụlọ gị mgbe ịnọghị ya.
Na mba Brazil na nsonso, ndị uweojii nwụchiri icheoku maka gbara ndị nwe ya ama bụ ndị a na-enyo enyo maka ibu ọgwụ ike na ndị uweojii na-abịa.
Agbannyeghị ama ahụ ndị uweojii nwetara ndị ahụ nakwa igbo na nnukwu ego ha dowere n'ụlọ ha.
Nkịta

Ebe foto si, Amaka Umeh
Nkịta bụ anụ ụlọ nke ụfọdụ mmadụ na-enu maka ịchụnta na nchekwa.
Nkịta na-emekwa mmadụ onye nke abụọ, ọ na-amata mgbe nsogbu dị ma gbara onye nwe ya ama.

Ebe foto si, Amaka Umeh
Na nkọwa, oriakụ Amaka Umeh bụ onye ihe nkịta na-amasị gwara BBC Igbo na nkịta ya nwebigara ịhụnanya ebe ọ na oke nke ọ naghị enye onye ọ maghị ohere ịbịa ya nso.
" Spike hụrụ na anya nke ukwu, mụnwa hụkwara ya.
"Otu oge ada m nọ na mahadum lọtara, Spike amaghị ya n'ihi na ọ nọghị n'ụlọ oge a zụtara ya. Oge ọ bịara ịmakụ m, Spike ajụ, bịa kwesiri n' etiti mụ na nwa nwaanyị na-aba mba."
N'abalị, ọge bụ na nwa m nwaanyị dinara ala n'elụ akwa, Spike bịara nọchie n'etiti akwa, nwa m nwaanyị megarịa ahụ, ọ bawa." okweghị ka ahụ
"Mana ọ naghị echefu ihe. O nwere ọgugụ isi. Ime ya ihe ọ gba gị nkịtị. mana ụbọchị ọ ga-abọ gị ya , ọ gaghị emere gị ebere."
Nwamba

Na agbanyeghị n'ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ nwaba egwu, ụfọdụ mmadụ na-akpa nwamba maka ha nnọkọrịta ya na iji ya egbu oke.
Dịka nkịta, nwamba na-anụ isi ihe egwu n'ihi na ntị dị ya nkọ karịa mmadụ, ebe ọ na-ahụkwa ụzọ n'ọchịchị.
O nwere ike ịnụ ụghara edoghị ya anya bewa akwa karịa etu o si ebe na mbụ nke ga-enye onye nwe ya ohere ịchọpụta ihe na-eme.









