Parrot arrested : Anụmanụ atọ ndị ga -abara gị uru n'ụzọ ị tụghị anya

Icheoku,nwamba na nkíta

Ebe foto si, BBC/AmakaUmeh

Nkọwa foto, O nwere anụmanụ ndị na-egboro mmadụ mkpa mmadụ na-egbo na anaghị ego

Ewezụga ị bụ ihe oriri nakwa ihe na-enyere mmadụ aka n'ọrụ, anụmanụ ụfọdụ bara mmadụ uru n'ụzọ pụrụ

Lee anụ enunu atọ na nnyere mmadụ aka n'ihe ha na-emere ndị nwe ha.

Icheku

Icheoku

Icheoku bụ nnụnụ na-efe n'elu mana ọtụtụ mgbe ndị mmadụ na-akpa ya n'ụlọ dịka enunu.

Ọ na-enwe ọnụ gbakọrọ agbakọ, na-enwekwa agwa dị iche iche mana ọtụtụ ha na-acha akwụkwọ ndụ, akwụkwọ ndụ maọbụ aja aja.

Icheoku so na nnụnụ nwere oke amamihe. A makwa ya dịka nnụnụ na-ejije mmadụ. nke mere ọtụtụ ji enwe mmasị na ya.

Ihe mere icheoku anụmanụ pụrụ iche bụ n'ọ bụ ọgba ama. I hapụya n'ụlọ ọga-akọọ gị ihe mere n'ụlọ gị mgbe ịnọghị ya.

Na mba Brazil na nsonso, ndị uweojii nwụchiri icheoku maka gbara ndị nwe ya ama bụ ndị a na-enyo enyo maka ibu ọgwụ ike na ndị uweojii na-abịa.

Agbannyeghị ama ahụ ndị uweojii nwetara ndị ahụ nakwa igbo na nnukwu ego ha dowere n'ụlọ ha.

Nkịta

Nkịta

Ebe foto si, Amaka Umeh

Nkọwa foto, Spike na-eche onye nwe ya ihe nkịta na-eche nsị

Nkịta bụ anụ ụlọ nke ụfọdụ mmadụ na-enu maka ịchụnta na nchekwa.

Nkịta na-emekwa mmadụ onye nke abụọ, ọ na-amata mgbe nsogbu dị ma gbara onye nwe ya ama.

Amaka Umeh

Ebe foto si, Amaka Umeh

Nkọwa foto, Amaka Umeh: Spike nwere ọgụgụ isi, ọ naghị echefu ihe

Na nkọwa, oriakụ Amaka Umeh bụ onye ihe nkịta na-amasị gwara BBC Igbo na nkịta ya nwebigara ịhụnanya ebe ọ na oke nke ọ naghị enye onye ọ maghị ohere ịbịa ya nso.

" Spike hụrụ na anya nke ukwu, mụnwa hụkwara ya.

"Otu oge ada m nọ na mahadum lọtara, Spike amaghị ya n'ihi na ọ nọghị n'ụlọ oge a zụtara ya. Oge ọ bịara ịmakụ m, Spike ajụ, bịa kwesiri n' etiti mụ na nwa nwaanyị na-aba mba."

N'abalị, ọge bụ na nwa m nwaanyị dinara ala n'elụ akwa, Spike bịara nọchie n'etiti akwa, nwa m nwaanyị megarịa ahụ, ọ bawa." okweghị ka ahụ

"Mana ọ naghị echefu ihe. O nwere ọgugụ isi. Ime ya ihe ọ gba gị nkịtị. mana ụbọchị ọ ga-abọ gị ya , ọ gaghị emere gị ebere."

Nwamba

Nwamba

Na agbanyeghị n'ụfọdụ ndị mmadụ na-atụ nwaba egwu, ụfọdụ mmadụ na-akpa nwamba maka ha nnọkọrịta ya na iji ya egbu oke.

Dịka nkịta, nwamba na-anụ isi ihe egwu n'ihi na ntị dị ya nkọ karịa mmadụ, ebe ọ na-ahụkwa ụzọ n'ọchịchị.

O nwere ike ịnụ ụghara edoghị ya anya bewa akwa karịa etu o si ebe na mbụ nke ga-enye onye nwe ya ohere ịchọpụta ihe na-eme.

Akụkọ ga-amasị gị