Nutrition: Ịhapụ iri nri ụtụtụ o nwereike igbu gị n'oge erughị eru?

Ebe foto si, @chefmide
Nri ụtụtụ bụ nri a kpọrọ mkpa kachasị mkpa kwa ụbọchị; akara na akamu, akamụ na ọkpa, mai-mai na akamụ, ji mmanụ, ji na akwa.
Na nchọpụta e wepụtara n'ụbọchị iri abụọ na abụọ n'ọnwa Eprelụ si n'aka mahadum nke ndị na-amụta ihe gbasara obi n'Amerika bụ 'American College of Cardiology' na Bekee si iri nri ụtụtụ nwere ike ịzọpụta ndụ mmadụ ma gụnyekwa ọrịa obi.
Ngosipụta gosipụtara na n'ime ndị tozuru ihe e ji mmadụ eme ruru 6,550 siri afọ iri anọ ruo afọ iri asaa sonyere n'ime ndị e jiri mee nchọpụta n'ihe gbasara nri site afọ 1988 rue 1994.
Ndị soro mee nchọpụta kwuru ugboro ha riri nri ụtụtụ.

Ebe foto si, Getty Images
Pasentị ise ndị a jụụ ajụjụ sị na ha anaghị eri nri ụtụtụ, pasentị 11 sị na ọ bụ ọ dịkata ha erịe, ebe pasent 25 sịị na ha na-erị mgbe ụfọdụ.
Ndị nchọpụta ahụ nyochara ndị nwụrụ were afọ 2011 - mmadụ dị 2,318 ndị sonyere na nnyocha ahụ anwụọla were hụ na o nwere ihe jikọrọ ka mmadụ si eritebe nri ụtụtụ na ọnwụ.
Akụpụ ihe ndị ọzọ nwere ike ibute nsogbu dịka ịṅụ sịga maọbụ ibu oke ibu, ndị ọkamụta na-eme chọpụtara na ndị anaghị eri nri ụtụ ji pasenti 87 nwe ike ịnwụ site nọ ọrịa obi karịa ndị na-eri.
Lee ihe ntụziaka
Nchọpụta na arụ aka na ịhapụ nrị ụtụ nwere ike ibute nsogbu ahụike mana ndị ọkamụta Sayensi na achọ ịmata ka nke siri eme.
Ngalaba na-ahụ maka ahụike ọha na mba Briten kwuru na nchọpụta ahụ egosighị hooha na "ịhapụ nrị ụtụtụ bụ ya bụ ihe na-ebute ọnwụ site n'ọrịa obi".

Ebe foto si, Getty Images
NHS kwuru na websaitị ha sị, "Ndị anaghị erị nri ụtụtụ( e jiri mee nchọpụta ahụ) bụkarịrị ndị na-ṅụbu sịga, ndị na-aṅụ oke mmanya na ndị anaghị emegharị eme mmegharịahụ; ndị anaghị erịezigbo nri, enweghị ego."

Ebe foto si, @matsecooks
"Nchọpụta ahụ nyoro naanị otu nri ụtụtụ nke nwere ike ọ gaghị egosipụta ka onye si ebi ndụ ya.
Mana Dọkịta Bao, onye bụ ọkammụta na ihe gbasra ka ọrịa sị ekesasị na mahadum, 'University of Iowa' kwụsiri ike na nchọpụta ha mere.

Ebe foto si, Getty Images
Bao kwuru sị: "Ọtụtụ nchọpụta egosila ịhapụ nri ụtụtụ ga-ebulite ohere ịnwe ọrịa shuga, ọbara mgbalielu na oke mmanụ ọjọọ."
"Nchọpụta anyị na-arụ aka na iri nriụtụtụ bụ ụzọ dị mfe isi gbalahụ ọrịa obi."
Dịka WHO siri kwuo, ọrịa obi na ahụ mgbọnwụ bụ ihe kachasị ebute ọnwụ na mba ụwa dịka o na-egbu ọnwụ mmadụ dị nde 15.2.









