South Africa Attacks: 'Anyị agaghi eti ndị si Saụt Afrịka lọta aka n'obi' Gọọmentị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images/@ABIKEDABIRI/TWITTER
Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ndị Naịjirịa nọ mba ofesi bụ Abike Dabiri ekuola na gọọmenntị etiti agaghị eburu ibu ndị sị mba Saụt Afrịka gbalata maka ogbugbu mmadụ na mmebi akụnaụba ndị mbịarambịara na mba ahụ.
Dabiri-Erewa gwara ndị ntaakụkọ na ọ bụ ihe onye nnọchịteanya pụrụiche Onyeisiala Muhammadu Buhari zigara Saụt Afrịka gwara ya ga-ekpebi ihe gọọmentị ga-eme.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na ọ bụ mba Saụt Afrịka ka gọọmentị Naịjirịa ji n'aka maka arụ a emere n'ebe ahụ.
Onyeisiala Buhari ga-enwete mkpesa nke onye nnọchite anya pụrụiche ahụ bụ Afrịka bụ Ahmed Rufai Abubakar taa.
Onyeisiala Buhari gosiburu na obi adịghị ya mma maka mwakpo ikpa oke a na-awakpo ndị Naijirịa bị na Saụt Afrịka.
O zigara Ahmed Rufai Abubakar bụ onyeisi ndị uweojii nyocha nke Naijiria ozi na mba Saụt Afrịka nke gunyere ka ndị mba Saụt Afrịka tinye uche ikwusi mwakpo ikpa oke.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nnọchite anya Naịjiria na mba Saụt Afrịka na-ekwu na ihe karịrị mmadụ narị isi egosila mmasị ha iso ụgbọelu nke ụlọọrụ Air Peace wepụtara maka ibulata ndị mmadụ Naịjirịa.
Onyeisi ụlọọrụ nnọchiteanya Nigeria na obodo Johannesburg bụ Godwin Adama kwuru nke a na mkparịtaụka ya na ndị News Agency of Nigeria nwere n'ekwentị.
Adama kwuru na ndị mmadụ ka na-edenyekwa aha ha ịhapụ Saụt Afrịka lọghachi Naịjirịa n'ihi ọgbaaghara sitere n'ịkpa oke agbụrụ.
N'otu aka ahụkwa, onye ji ọkwa Kọmishọna di elu nke Naịjiria na mba Saut Afrịka bụ Kabiru Bala, kwukwara na ihe niile na-aga n'anya ya.
Bala kwuru na "ọtụtụ ndị denyere aha ha ịlọghachite Naịjiria enweghi akwụkwọ njem zuruoke."
"Anyi na-eleba ya anya. Ndị akwụkwọ ha ezughi ezu, anyị ga-enye ha akwụkwọ gbanụ gbanụ, ka ha wee mee ya bụ njem."
Cheta na BBC Igbo nwere mkparịtaụka pụrụ iche na soshal midia "Facebook" n'ụbọchị Satọdee gbasara ọgbaaghara "Xenophobia" na mba Saụt Afrịka.
Mana n'ụbọchị ụka, ọtụtụ ndị ntorobịa na Saụt Afrịka mere ngagharị iwe, na-ekwusi ike na ha achọghizi ndị mbịarambịara ọbụla na obodo ha.
Ndị otu MASSOB

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu MASSOB agbarụọla ihu maka mgbachi agbachiri ọdọugboelu nke Akanu Ibiam Enugwu steeti na-enyeghị oge a ga-arụcha ya maọbụ ego ọle a ga-eji rụo ya.
Massob kwuru na nyocha ha gosiri na Gọvanọ Dave ụmahị na Onyeisiala Buhari na-akpa nkata iji wetuo ọnọdu ọdọụgbọelu ahụ ka ọ bụru nke anaghị efepu ụgbọelu na-aga ofesi.
Okorocha na Ihedioha ka na-alụ

Ebe foto si, Twitter/@realRochas
Aka chịburu Steeti Imo bụ Rochas Okorocha agwala gọvanọ Emeka Ihedioha ka ọ taa odeakwụkwọ steeti ahụ bụ Uche Onyeagaocha ahụhụ maka ịkpọ oku ka anwụchie ya.
Sam Onwuemeodo bụ ọnụ na-ekwuru Okorocha kwuputara nke a n'akwụkwọ ozi o wepụtara n'ụbọchị ụka.
O kwuru na oku ahụ Onyeagaocha kpọrọ adabaghị adaba n'iwu ma ncha
N'Ofesi

Ebe foto si, Press Association
Ndị ụlọ ọrụ British Airways akwusịla njem ụgbọelu ha niile dịka ndị na anya ụgboelu ha gbara agbụru ọrụ abalị abụo maka ụgwọ ọnwa.
Nkwụsị njem a metutara ndị njem rụrụ out narị puku na puku iri itolu na ise.
Ebelebe egbuola na Tokyo

Ebe foto si, AFP
Na mba ofesi, ajọ ikuku na oke mmiri ozuzo nke mere na mba Japan emeela ka ụlọ karịrị puku narị itoolu nọrọ na-enweghị ọkụ Latrik.
Ihe ọdachị nke a mere n'obodo Tokyo mekwara ka a kagbuo njem ụgbọelu karịrị otu narị na iri atọ.
Otu nwanyị gbara afọ iri ise (50) maọbụ karịa gharịpụrụ mgbe ikuku buuru ya kụọ ya isi n'ahụ aja.
O mechara nwụọ n'ụlọọgwụ.
Odogwu Rafael nwa Nadal

Ebe foto si, Twitter/@usopen
N'egwuregwu, Rafael Nadal gosiri ihe o ji bụrụ odogwu mgbe o meriri Daniil Medvedev nke mba Rọshia iji wee mabulie iko nke US Open n'isi ụtụtụ taa.
Asọmpi were awa anọ na nkeji iri ise tupu apịachaa ya.
Ka ọ dị ugbua, ọ fọdụụrụ Nadal otu iko "major" ọzọ ka ya na Roger Federer hara na ndị kacha bute iko "major" n'egwuregwu tennis.
Cheta na nwata nwanyị aha ya bụ Bianca Andreescu meriri Serena Williams na asọmpi US Open nke ụmụnwanyị a pịara n'ụbọchị Satọdee.
Azubuike Egwuekwe abanyela Rivers United nke Naịjiria
Ọgbaa bọolụ otu Super Eagles bụ Azubike Egwuekwe esirila otu egwu bọolụ Al Nasr Benghazi nke Libya were banye Rivers United nke Naijirịa.
Egwuekwe so na ndị otu Super Eagles nke meriri asọmpị Ikọ mba Afrịka nke afọ 2013 na Saụt Afrịka.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:











