South Africa Killings: Ụmụ Naijiria ewerela iwe mebie ihe n'ọdọ ahịa Shoprite, PEP

Ebe foto si, Twitter/#XenophobicAttack
Dịka ngagharịiwe nke gara na-enweghị nsogbu ọbụla na Shoprite, Ikeja, Legọs, ghọrọ tigbuo-zogbuo mgbe ihe yiri ya mere na Shoprite dị n'Ọsapa/Jakande, Legọs ụbọchị Tuzde.
Nke a na-eme dịka akụkọ ogbugbu ụmụ Naijria na mmebi ngwaahịa ha na-arị elu, abalị ole na ole gara aga.
Ndị ntorobia banyere n'ime Shoprite dị na Jakande were iwe na-akwatu ngwaahịa nọ n'ogogo ebe ahụ.

Ebe foto si, Temmy
ebe ndị ntorobịa ji okwute na mma obejiri wakporo ụlọahịa ahụ na-ekwu na ha na-achọ ụmụ Saụt Afrịka ka ha gbuo ha maka ụmụ Naijiria ha kwafurula ọbara ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Otu onye Nollywood bụ Belinda Effah onye nọ n'ụgbọala nọ n'okporoụzọ dị nso na Shọprite dị na Jakande, bekuru gọọmentị ka ọ gbata ọsọ enyemaka tupu ihe emebie dịka ndị nọ n'ụzọ ije mgbe ọ na-akpọtụ hapụrụ ụgbọala ha gbaa ọsọ ndụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ya bụ ọgbaaghara ataala isi otu onye ebe a gbara otu ụgbọ ndị uweojii ọkụ.
Ọgbaaghara ahụ mere ka e mechie ọdọahịa Shoprite ahụ n'ike.

N'aka nke ọzọ, ndị mmadụ wakporo ọdọahịa PEP dị na Surulere dịkwa na Legọs.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mbọ BBC Igbo gbara ịnụta okwu ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Legọs bụ Bala Elkana banyere nsogbu dapụtara na Legọs amịtaghị mkpụrụ dịka nwa amadi ahụ azaghị ekwentị ya.
Kwụsịnụ iwakpo ọdọ ahịa ndị South Africa - Gọọmentị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images
Ka ọ dị ugbua, Gọọmenti etiti adọọla ụmụ Naijiria aka na ntị sị ka kwụsị ibu agha megide ụlọọrụ ndị Saut Afrịka na Naijiria.
N'ozi nke m̀ịnịsta na-ahụ maka mgbasaozi bụ Lai Mohammed wepụtara, O kwureur na ntụpụ ụkwụ a ga-emetụta Naijiria karịa Saut-Afrika.
Na nkọwa, ya ụmụ Naijiria na-arụ ọrụ n'ụlọọrụ ndị Saut Afrịka nọ na Naijiria karịrị ndị Saut Afrịka.









