Anambra road accident: Etu ihe mberede okporoụzọ tara isi mmadụ isii n'Anambra si mee

Ụgbọala kpọkasịrị

Ebe foto si, Odinaka/Anambra

Nkọwa foto, Foto ihe mberede meburu n'Anambra na nso nso.

Ndị uweojii Anambara steeti na-ekwu na ọ bụ mmadụ isii bụ ihe nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ mere na nso ọdọmmiri Agụlụ, dị n'Agụlụ, Anambara steeti ahụ, ebe mmadụ ise merụrụ ahụ.

Nke a mere dịka ngwongworo na ụgbọala atọ gụnyere ụgbọala L300 Mitsubishi, ụgbọala Toyota sienna na ụgbọala Toyota camry, sukọtara ọnụ.

E bugara ndị merụrụ ahụ ụlọọgwụ St. Joseph dị n'Adazi, ebe ha na-anata nleta ọgwụgwọ.

Ka ọ dị ugbua, gọvanọ Willie Obiano bụ aka na-achị steeti ahụ na onye Kọmịshọna ndị uweojii na steeti ahụ bụ John B.Abang, agaala ebe ihe mere.

Obiano nọ ebe ahụ kwe nkwa na ọ ga-eji aka ya akwụ ụgwọ ụlọọgwụ ndị merụrụ ahụ.