Tanker Accident: Buhari etiela ndị Anambara aka n'obi

Ebe foto si, Odinaka/Anambra
Ụgbọala 'Tanker' bu mmanụ ọkụ dapụrụ na "gear" kwọgbuo ndị mmadụ n'Ọnịcha, Anambara steeti ụbọchị Wenezde.
Ihe mberede a nke mere na nso ụlọogwụ Toronto Hospital dị n'Upper Iweka, merụrụ ọtụtụ ndị mmadụ gụnyere ndị na-agafe agafe, ndị nwe ụlọahịa na ndị ọzọ, ahụ, ma gbuo ọtụtụ ndị ọzọ.
A mabeghị mmadụ ọle nwụrụ mana otu onye nọ oge ya bụ ihe mere kwuru na ihe nwụrụ ruru iri.
O kwukwara na ọkwọụgbọala tanka ahụ hapụrụ ya gbalaga ozugbo ihe mberede a mere.

Ebe foto si, Odinaka/ABS
Onye ntaakụkọ ABS rutere ebe ahụ ka ihe a mere, kwuru na ebupula ụgbọala tanka ahụ ebe ahụ.

Ebe foto si, Odinaka/Anambra
Ebe Uche Nwosu kwụ ugbua,
Uche Nwosu bụ onye a kpọpụtara aha ya dịka onye gbara onye abụọ na ntuliaka gọvanọ Imo steeti, ekwuola na ọ ga-aga ụlọikpe ịzọ mmeri ọ sị kwesịrị irute ya aka.
Ọ gwara BBC Igbo sị:
N'akụkọ yiri ya,
Onye bụbu onyeisi otu APC n'Imo steeti bụ Dan Nwafor, gwara BBC Igbo na APC chụpụrụ Hope Uzodimma maka ime ihe bekee kpọro "anti-party activities".
Nwafor kwukwara sị na Emeka Ihedioha bụ onye Inec kpọpụtara aha ya dịka onye meriri na ntuliaka Imo steeti, ekwesịghị inweta mmeri makana o nwerughi opekatampe pasentị iri abụọ na ise n'ime vootu a tụrụ n'okpuruọchịchị iri na asatọ n'ime okpuruọchịchị iri abụọ na asaa dị n'Imo steeti.
Gụọ ihe ndị o kwuru n'uju ebe a: 'PDP enweghi mmeri n'Imo state' - Nwafor
Ụlọelu dara na Legọs,
Nke na-eme ugbua bụ na ihe ruru ụmụakwụkwọ asatọ anwụọla ebe ihe karịrị mmadụ narị ka tọrọ n'okpuru ala ka ụlọelu ruru ogogo atọ dara na Legọs taa.
Otu onye ụlọọrụ kwuru na a zọpụtala ihe ruru ụmụakwụkwọ iri anọ. Bịa na Facebook BBC News Igbo, ebe ị ga-ahụ ihe onyonyo na-egosi ka o si aga ugbua.
Akụkọ etu o si mee dị ebe a: Building collapse in Lagos; Ihe karịrị mmadụ itoolu anwụọla n'ime ụlọ dara na Legọs
Lee ihe nkiri na-egosi ka e si agbalị ịkpọpụta ndị mmadụ ebe a:
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 1
Nakwa
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post, 2
N'egwuregwu,
Ọ ga-akpọtụ taa mgbe Barcelona ga-ezute Lyon, ebe Bayern Munich ga-ezutekwa Liverpool ịzọ onye ga-abanye agba anọ-ikpeazụ.
Ọzọ,
Ogbonnia Nwodo bụ onyeisi otu Ohaneze Ndigbo agwaala ndị Igbo niile ma ndị bi na mba ofesi ha gbakọọ aka tinye ike n'iwulite ala Igbo.

Ebe foto si, Ohaneze/fb
Ọ gwara ha mee ka ala Igbo bụrụ ebe ga na atụ ndị ọzọ akpịrị.
N'ime ozi ọ zigara BBC Igbo, o ji kwa ohere ahụ kelee ndị Igbo maka etu ha si pụta n'igwe mmadụ sonye na ntuliaka abụọ e mere, sị ha "jisienu ike"
Ọzọ,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ngalaba Inec ewepụtala ụbọchị iri abụọ na ato nke ọnwa Maachi dịka ụbọchị a ga-emegharị ntuliaka n'ebe niile emerughi ntuliaka n'isi nke Bekee kpọrọ inconclusive.
Na mba ofesi,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Dịka obodo ndị ọzọ na-amachi ụgbọelu Boeing 737 Max, Ngalaba na-ahụ maka njem ụgbọelu na mba Amerịka ajụla ịme ka ibe ha mere.
Nkọwa ha bụ na nyocha ha mere egosighi ihe ọbụla adịghị mma nke mere n'onweghi ihe a ga-atudo aka were machie ya bụ ụgbọelu
N'egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Man City akwọpịala Schalke 04 ka agbụsị mgbe ndị Schalke bịara n'ọgbọ egwuregwu Etihad dịka ha ji goolu asaa asataghị otu dọọka neeti ha.
Site na mmeri a, Man City ekwoferela banye n'agba nke anọ-ikpeazụ n'asọmpị ahụ.










