Nigeria's debt burden: Atiku ebola aka n'isi tie mkpu maka oke mbibi ego Naijirịa na-ebite

Ebe foto si, @Atiku
Atiku Abubakar, onye zọburu ọkwa onyeisiala n'aha PDP etiela mkpu na oke ego Naijiria na-emefu n'ịkwụ ọmụrụ nwa dị n'isi ego Naijiria bitere, na-achụzi ego na-abata n'akpa gọọmentị.
Ozi si ministri akụnaụba obodo na-egosi na ọnwa isii gara aga, e tinyere ijeri naịra itoolu na ụma iri anọ na atọ (₦943.12bn) n'ịkwụ ọmụrụ nwa a, ebe ego batara bụ ijeri narị naịra itoolu na ụma iri ise (₦950.56 bn).
Atiku sị na ya bụ ihe ya hụrụ n'akwụkwọ usoro mkpata na mmefu akụ nke agba nke mbụ nke 2020 gbagwojuru ya anya.
Ọ sị na ọmụrụnwa dị n'isi ego gọọmentị Naịjịria bitere ji pasentị iri itoolu na itoolu (99%) chụwa ego ha na-akpata.
Atiku sị "Onye arafula unu, nke a bụ ezigbo nsogbu. Ọmụrụnwa dị n'isi ego i bitere ekwesịghị ịkarị ego ị na-akpata".
Ọ dọrọ aka na ntị sị na "Ọ bụrụ na Naịjirịa achọtaghị ụzọ ọzọ ha ga-esi akpata ego, oge ga-eru mgbe ego anyị na-akpata agaghị akwụli ụgwọ anyị ji. Nke a pụtara na ndị anyị ji ụgwọ nwereike ịbịa wekọrọ akụnaụba anyị dịka mba Sri Lanka na Maldives".
Ọ kpọkuru gọọmenti etiti ka ha were ọsọ were ije wetuo aka n'ego ha na-etinye n'ọchịchị dịka ụgbọelu (nke na-ebu onyeisiala) ha kpojuru ebe niile karịdịa nke ndị ha na-ebite ego nwere, nakwa ụlọ ha na-arụgharị ebe niile ya na njem ala Bekee ndị ọrụ oyibo na-eme.
Atiku kwuru na onye ọkụ na-agba ụlọ ya anaghị achụ oke nke bụ na gọọmenti etiti kwesịrị ịchọwa ụzọ ha ga-esị akpata ego ọsịsọ, ma kwụsị ịghọ ndị mmadụ aghụghọ.

Ebe foto si, Sam Ohuabunwa/Fb
Mazị Sam Ohuabunwa bụ onye ihe gbasara mkpata na mmefu akụ doro anya kwenyere na ya bụ egwu Atiku na-atụ.
Ọ sị na n'ezie, ndị ebitere ego nwereike ịbịa were akụ na ụba Naịjirịa, mana na-enwere ụzọ ọzọ ha ga-esi gbata ụgwọ ego ha karịrị ịnwere akụ na ụba Naịjirịa.
Ọ sị na "ha nwereike ịme ka ego Naịjirịa tipie etipie nke bụ na-ọnweghịzị ihe ọ ga-egoteli na mba ụwa. Onweghịzịkwa ndị ga-atụkwasa Naịjirịa obi maka iresi ha ihe ma ha ejighị ego".
Ohuabunwa kwukwara na ibite ego adịghị njọ mana ihe na-agba anyammiri na nke a bụ na ndị ọchịchị Naịjirịa anaghị eji ego ha eme ihe ga-amitara ha mkpụrụ.
Ọ sị na ụta diiri ndị ọrụ gọọmenti nke ọ na-eche na ya bụ ọrụ edocheghị ha anya.
Ọ sị na ihe mbụ ha kaara ịme bụ ịkowe akpa ha ebe aka ha ga-eru site na ịwedete aka n'ihe na-erị gọọmenti ego ma webete ndị ma ọrụ maka mkpata na mmefu akụ.
Ohuabunwa che na ka ọ dị ugbua, ọ dịka ndị ọchịchi emecheela ike ha maka na "onye ọbụla ga-agbali otu ike ya ha".
Ị ma ego ole ị ga-eketa ma e kee ụgwọ Naịjirịa ji ugbua?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka ngalaba na-ahụ maka ụgwọ Naijiria ji n'ụlọ na nke e ji mba ndị ọzọ bụ Debt Management office na Bekee dere na websaịtị ha, Naijiria ji tarịị naira iri abụọ na anọ na ụma (N24.94 trillion) n'ụgwọ nke pụtara ijeri dọla iri asataọ na otu n'ụma ($81.27 billion).
Ihe nke a pụtara bụ na e kewe ya bụ ụgwọ n'etiti nde narị mmadụ abụọ (200m) bụ ụmụ Naijiria, onye Naijiria ọbụla ga-eketa naịra puku narị na puku iri abụọ na otu (N121,000).
N'ọnwa Septemba afọ 2018, ụgwọ Naijiria ji kwụbu na tarịị naịra iri abụọ na abụọ na ụma (N22.43tn.), ebe n'ọnwa June afọ 2015, ụgwọ e ji bụ naanị tarịị naira iri na abụọ na ụma (N12.12tn).
Na nso nso a, onyeisi ụlọakụ mba Afrịka a kpọrọ 'the African Development Bank' bụ Dr. Akinwumi Adesina, tiri mkpu etu ụgwọ Naijiria ji si agbalitela, nke mere na e jizi ihe dịka pasent 50 ego e nwetara wee na-akwụ ụgwọ e ji eji.

Ebe foto si, Getty Images
Mana kedụ ka ụgwọ Naijiria ji siri gbasa ụmụ Naijiria nọrọ onwe ha? Kedụ ihe ụgwọ a na-ewepụ n'ahụ ụmụ Naijiria?
Onye ọkachamara n'okwu akụnaụba bụ Boniface Chizea, kọwara ụzọ ụmụ Naijiria si eketa oke n'ụgwọ Naijiria ji bụ:
"A na-eji ihe dịka pasent 50 ego na-abata akwụ ụgwọ e ji eji nke pụtara na ị nweta naịra 100, i were naira 50 kwụọ ụgwọ i ji."
"A kwụchaa ụgwọ ndị a, ego a ga-etinye n'ụlọọgwụ agaghị adị, ego a ga-etinye n'ụlọakwụkwọ agaghị adị."

Ebe foto si, Debt Management Office
Ụzọ ndị ọzọ o si metụta mmadụ nkịtị gụnyere:
1. Enweghị ezigbo ụlọọgwụ, okporoụzọ na ihe mmepe ndị ọzọ
2. Ọ na-eme ka ahụhụ kawanye njọ
3. Ọ na-eme ka ụbịam karịa.
4. Ọ na-eme ka mpụ na nsogbu nchekwa karịa
5. Ọ ga-enye nsogbu ma a gawa ibi ego ọzọ, mee ka o sie ike
Ihe mere ọnọdụ ụgwọ Naijiria jiri dị elu
Chizea kọwara na ihe butere nsogbu oke ụgwọ Naijiria ji ugbua bụ ọtanisi riseshọn (Recession) nke mere n'afọ 2016.
1. "Ndị na-achị achị, ha bite ụgwọ, anaghị ama ihe ha ji ego ha bitere eme."
2. Ahịa mmanụ dakpọrọ
3. Ụfọdụ ego e bitere bụ ụgwọ ọnwa ka e jiri ya kwụọ."
Akụkọ ndị ga-amasị gị:











