Minimum wage: A ga-amalite ịkwụ ụgwọ ọnwa opekatampe N30,000

Ebe foto si, @NGRSenate
Ụlọomeiwu ukwu Naịjirịa ebinyela aka n'akwụkwọ ga-eme ka a na-akwụ ndị ọrụ puku naịra iri atọ n'ụgwọ ọnwa opekatampe.
Nke a na-abịa ka ọnwa ole na ole a malitere ikwu okwu ma a ga-akwụ ya maọbụ agaghị akwụru ya, gafechara.
Ụfọdụ oge ka ndị "Nigerian Labour Congress (NLC)" mere ngagharịiwe ime ka gọomentị mara etu ọ dị ha n'obi, mana a ka dọtịrị okwu ịkwụ ụgwọ a ruo ugbua ndị ụlọomeiwu binyere ya aka.
N'elu akara Twitter ha, ndị ụlọomeiwu tinyere ihe onyonyo na-egosi etu ha si binyeaka n'akwụkwọ mkpebi ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Bukola Saraki, kwuru sị na ọ na-ebunye ndị ngalaba na-ahụ maka ndị ọrụ bụ NLC ụkpa ekele, ka ha si kwanyere onwe ha ugwu ka ha na-agba mbọ ịhụ na e mezuru ebumnobi ha.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Ihe ndị mmadụ nwere ikwu maka ya na soshal midia:
@Mueghtor kwuru sị na ọ fọrọ ka a malite ịkwụ ya, na ọ bụghị naanị ibinye aka n'akwụkwọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@AkinbodeTa chọrọ ịma ego ole a ga-amalite ịkwụ ndị na-efe ala nna (ndị NYSC).
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
@dazzleriri kwuru na ego a ka pere mpe makana ihe ndị dịka ngwanri na-ada ezigbo ọnụ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ihe ndị ọrụ nwere ikwu maka iri puku iri atọ

Ebe foto si, Getty Images
Ụfọdụ ndịọrụ obodo na Naịjirịa ekwupụtala uche ha gbasara ụgwọọnwa opekatampe N30,000, bụ nke na-eko achịcha kemgbe.
Na agbanyeghị na ha gosipụtara afọ ojuju ha nye nkwekọrịta nke gọọmentị ịkwụ ụgwọ a, ha kwuru na N30,000 enweghị ihe pụrụiche ọ ga-emere ha.
Ha tụrụ aka n'ọnọdụ akụnaụba nakwa ogo obibi ndụ na-akawanye njọ na Naijiria.
N'okwu ha gwara BBC Igbo, Nonso Okere kwuru na ego ahụ bụ N30,000 enweghị ihe o zuoro ya n'ihi na ego ya na-emefu ụbọchị ọbụla karịrị N30,000 n'ọnwa.
O nyere nkọwa sị: ''kwa ụbọchị, ana m emefu N600 n'ụgbọala, rie nri N500. Chetakwa na e nwekwara ihe ndị ọzọ mmadụ kwesiri ime dịka ịkwụ ụgwọ ụlọ nakwa ihe ndị ọzọ''.

Ebe foto si, PIUS UTOMI EKPEI
Na nke ya, Lilian Nwankwo kọwara na ya na-emefu ihe karịrị N1,400 kwa ụbọchị, ma rịọzịe gọọmenti n'ogo dị icheiche ka ha jiri ya kpọrọ ihe.
''A na m akwụ ihe ruru N850 kwa ụbọchị n'ụgbọ ala n'ihi ebe m si abịa ọrụ, werenụ ihe dịka N350-N400 rie nri. Cheta na aga m emekwa ihe ndịọzọ dịịrị m dịka ụgwọ akwụkwọ ụmụ m''.
Mana ha gbakwụnyere na ọ bụrụ na gọọmenti dị icheiche na-akwụ ụgwọ a n'ezi oge, ọ ga-enyere ha aka igbo mkpa dịrị ha."
Ihe ndị a gụnyere, nri, ego ụgbọala, ego ahụike nakwa ihe ndị ọzọ ha ji enyere ndụ aka kwa mgbe.

Ha gosipụtara echiche ha dịka ndị ụlọomeiwu etiti nke nta kwupụtara nkwado ha nye puku naịra iri atọ dịka ụgwọọnwa opekatampe maka ndịọrụ obodo.
Cheta na otu ọgbakọ dị elu a kpọrọ Council of State nọọrọ n'oge gara aga wee bịanye aka n'akwụkwọ ka ụgwọ opekatampe bụrụ puku naịra iri abụọ na asaa.
Tupu oge a, ụgwọọnwa opekatampe ndịọrụ na Naijiria pụtara puku naịra iri na asatọ.

Ebe foto si, @AsoRock
Akụkọ ga-amasị gị:










