World population day: Ụmụ ole ka nne na nna kwesịrị ịmụ?

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Chimamaka Ihenacho
- Ndị mere akụkọ a, Broadcast Journalist, Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2
Ụmụ ole ka di na nwunye kwesịrị ịmụ n'agbanyeghị ihe isiike na ọnọdụ ndị ọzọ?
Site n'afọ 1979 ruo afọ 2015, mba dịka Chaịna nwere iwu megidere ụmụnwaanyị ịmụ karịa otu nwa, mana ụdịrị iwu a enwere ike ịdị na Naịjirịa?
A bịa n'ụfọdụ ezinaụlọ na Naịjirịa, e nwere nne na nna mụrụ ụmụ iri site n'otu nne, ebe ndị ọzọ lụrụ ọtụtụ nwaanyị mụta ọtụtụ ụmụ.
Mana dịka ọnọdụ akụnaụba obodo Naịjiria dị ugbua, nne na nna ekwesịrị ịnọrọ ala sị "ka anyị mụọ ụmụ ole a ka o nwee ike kwe anyị ọzụzụ"?
Ọtụtụ ndị BBC Igbo jụrụ ajụjụ kwuru sị na ọ na-aka mma ka di na nwunye mụọ ole ha ga-azụnwu.
BBC Igbo jụkwara onye ọ dị n'aka ikwu ụmụ ole e kwesịrị ịmụ n'ezinaụlọ, lee ihe ndị mmadụ sara:

Ebe foto si, Getty Images
Ụmụ ole ka e kwesịrị ịmụ?
Ọtụtụ oge na Naịjiria ka ndị mụrụ karịa ejima abụọ na-arịọ gọọmentị ọsọ enyemaka maka ahụghị ka e mere n'isi ụmụ ọhụrụ ha.
Ụfọdụ n'ime ha ka di ha gbaghapụrụ maka na ha amaghị etu ha ga-esi zụọ ụmụ niile ahụ.
Ndị ọzọ bụ ndị tufuru maọbụ ree nwa ha mụrụ maka na ha enweghị ikikere ha ga-eji zụọ ha.
Otu nwaanyị na-ekuputa nwa n'ụlọọgwụ nke Bekee kpọrọ 'midwife', bụ Ify Ukachukwu, gwara BBC Igbo na ọ ga-aka mma ka di na nwunye na-amụ naanị ụmụ atọ, ka ha nwee ike zụchaa ha.
Gee ihe o kwuru n'uju ebe a:
BBC Igbo jụrụ ndị na-agụ ha echiche ha banyere ụmụ ole nne na nna kwesịrị ịmụ, lee ihe ha zara na Facebook:
BBC Igbo na ndị nne na nna ka ha tinye ọnụ n'okwu a, lee ihe ha kwuru maka ya ebe a:
N'otu aka ahụ, lee ihe nkiri di na nwunye mụrụ ụmụ mbụ ha ka afọ 19 ha lụrụ gachara:











