Aha Igbo: Ihe kpatara ndigbo ji kwụsị ịgụ ụmụ ha ụfọdụ aha
Mgbe elu ka bụ ala ọsa, ọtụtụ ndigbo na-agụ ụmụ ha aha 'dị omimi', mana ọnọdụ ahụ agbanweela ugbua?
Aha bụ otu njirimara mmadụ, nke a ma dịka 'identity' n'olu Bekee.
Ọtụtụ oge ka aha na-akọwa ihe mmadụ gabigara na ndụ ya, maọbụ ọnọdụ onye ahụ maọbụ ezinaụlọ ya maọbụ agbataobi ya nọ oge a mụrụ ya.
Mgbe gboo, ndị Igbo na-agụ aha dị omimi ọ ga-abụ ị kpọbiri ya, ị nwereike ghara ịnweta ihe ọ pụtara, mana ị kpọruo ya n'isi, ị ghọta ihe ọ pụtara.
Ọmụmaatụ bụ 'Ogugbuoaja'...Ị kpọbiri ya etu a, ụjọ nwere ike ịtụ ndị mmadụ ịba ya nwa ha, mana ị kpọruo ya n'isi 'Ogugbuoaja-aja anaghị adị ire', mma ya bụ aha apụta.
Anaghị anụ aha ndị dịka 'Nkechereonyedịrịlaya', 'Akadịnmmajideakụ' maọbụ 'Nwokejiezi' maọbụ 'Ahụnwaelotanna', ugbua, makana ụfọdụ 'ndị ọgbara ọhụrụ' na-ahụta ya ka aha na-adịghị atọ ụtọ na ntị.
Ụfọdụ kwụsịrị ịgụ ụdịrị aha a makana ha kwenyere na ụka butere mgbanwe n'etu ndị Igbo si agụ aha, nke mere na ọtụtụ aha ndigbo na-enwe 'Chukwu' n'ime ya.
Nkwenye ụfọdụ bụ na aha ndị ahụ nwere ike ibutere onye na-aza ya chi ọjọọ.
Amarachi Nwankwo kwuru ihe mere o ji gụọ ụmụ ya 'Ọdụagụ' nakwa 'Beelụchukwu'. Gee ya n'uju:
Ugbua, ọ dịzị ka ndị mmadụ anaghị eche aha eche tupu a gụọ nwa ha aha.
Ụfọdụ na-akpọ aha ndị dịka 'Mọnde, Fraịde', nke bụ aha ụbọchị a mụrụ ha.
Oriakụ Leticia Ezeh kọwara ihe mere o ji họrọ aha ọ gụrụ ụmụ ya. Gee ya n'uju:
Ọkammụta Chiagozie Nnabuihe, gwara BBC Igbo na ụwa agbanweela ugbua, nke metụtara etu e si agụ aha.
O kwuru na Igbo na-agụbu aha site n'ụzọ atọ:
- Ezinaụlọ nwata si bịa ụwa.
- Ihe mere nne na nna nakwa agbata nwata tupu ọ bịa ụwa.
- Ihe a tụrụ anya maka ọdịnihu.
Gee ihe o kwuru n'uju:














