A nwụchiela ndị gburu ụkọchukwụ Katọlịk bụ Jude Egbom n'Imo Steeti

Ebe foto si, Enugwu Police Command
Ndị uweojii nwụchiri ụmụokorobia gunyere; Chigozie Uzokwu gbara afọ iri atọ na atọ na Peter Ochokwu gbara afọ iri abụọ na otu maka ebubo igbu Fada Jude Egbom, onye na-elekọta St. Patrick's Amuchu, Njaba, n'Imo steeti.
Nke a na-eme abalị ole na ole ndị ji egbe gbagburu Fada Egbom ebe ọ gara ịkpụ isi ma merụkwa ọnye nọ ọzụzụ maka ichi ụkọchukwu ya na ya so.
Kọmishọna ndị uweojii n'imo steeti bụ Dasuki Galadanchi, kwuru na ọ bụ mmadụ ise ahụ e jidere ka a na-enyo enyo na ọ bụ ha gburu ụkọchukwu Jude Egbom ebe ọ gara ikpụ isi n'elekere asatọ nke abalị ụbọchị ahụ.
Galadanchi kwuru na e jidere ndị omekome ahụ na Nkwerre ka ọnwa Septemba dị n'iri na otu.
O kwuru na ọ bụ mbọ ndị ọrụ ya nke a na-akpọ 'Tactical Unit' n'olu Bekee gbara, ka e ji nwụchie ha ozugbo ozugbo.
Otu onye n'ime ndị ogbu mmadụ ahụ bụ Uzokwu bụ onye ọ kọwara na e jidela ya ugboro ole ma ole maka iji egbe gaa ohi.
Uzokwu ka si ụlọmkpọrọ 'Owerri Prisons' ebe ọ nọrọ otu afọ maka iji egbe ezu ohi, wee pụta.
Na nkọwa ya, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Andrew Enwerem, gwara BBC Igbo na ihe mere ndị uweojii jiri nwuchie ndị a ngwa ngwa maka mkpamkpa kpara, bụ na ha ahazịgharịala ka ha si arụ ọrụ nchekwa dịka a banyerela ọnwa 'mber mber'.









