Onye ọkachamara agwaala ndị Naịjirịa ha dịrị njikere maka ihe isiike

Nwaanyị na-eche ndụ ya

Ebe foto si, Getty Images

Ugo Obi-Chukwu bụ onye ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ego gwara BBC Igbo etu ego funarịrị ụlọahia ego Naịjirịa ga-esi metụta nwa amadi.

Obi-Chukwu kwuru na ihe isiike n'abịa n'oge adịghị anya maka na ihe butere mmefu ego a bụ mgbe ndị na-achụ nta ego si esi bata na-ewepu ego ha maka etu ọnọdụ Naịjirịa si dị.

O kwuru na ọdọ ahịa ndị Naịjirịa dabere n'ego na-abata ga-enwe nsogbu nke ga-eme na ọnụ ngwa ahịa ga-arị elu ebe a ga-achụkwa ụfọdụ mmadụ n'ọrụ.

N'ọnụ ya "Ndị nta ego na-atu egwu ugbua maka ha amaghị ọdịnihu Naịjirịa, ya mere ha ji ebupu ego ha".

O kwukwara na siite n'ọnwa Juun rue ụnyahụ bụ ụbọchị 12 nke septemba, ego ruru tarịị naịra abụọ n'ọma funarịrị ụlọahịa ego Naịjirịa.

Ụlọ ahịa ego Nigeria

Ebe foto si, @nsenigeria

Nkọwa foto, Na nsonso a ụlọahịa Naịjirịa na-agbada n'ike n'ike

Cheta na ọkpụrụkpụ ego ruru ijeri naira 432, funarịrị ndị tinyere ego n' ụlọahịa ego Naijirịa nke a kpọrọ 'Nigeria Stock Exchange n'ụbọchị Tuuzde.

Nke a bụ nfunarị kachasị kemgbe ọnwa asatọ gara aga.

Ndị ọkachamara kwuru na ego a furu n'ihi oke egwu banyere ndọrọndọrọ ọchịchị dịka ntuliaka 2019 na-abịa nso.

Ka a zụchara ahịa ụnyaahụ bụ Tuusde, ego niile dị n'ahịa nke a na-akpọ 'Market capịtalization' ji Ijeri naira 432 gbada rue tarịị Naira 11.789 nke pụtara na o ji pasent 3..46 were daa.

Cheta na, na nsonso otu jikọrọ ụlọahịa ego a kpọrọ 'Association of Stockbroking Houses of Nigeria (ASHON)' kwupụtara n'akwụkwọ ozi odeakwụkwọ ha bụ Sam Onuokwe binyere aka kwụrụ na alaodejiji na-ede maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 butere na-emetụta ka ndị mmadụ si etinye ego n'ụlọahịa ego Naijiria.

Ha rịọrọ ka ndị ndọrọndọrọ ọchịchị jide onwe ha na ire ha aka iji mee ka obi kaa ndị na-etinye ego ha n'ụlọazụmahịa ego Naijiria ma kwalite akụnaụba Naijiria.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: