CBN adaala MTN nha ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọakụ etiti nke a kpọrọ Central Bank (CBN) na Bekee, dara ụlọọrụ ekwentị si mba Saụt Afrịka bụ MTN nha maka ibupu ijeri dọla 8.134 bụ ego ha na-ekwu ha bupuru na Naijiria n'ụzọ megidere iwu Naijiria.
Dịka akwụkwọ akụkọ Thisday siri kwuo, CBN mere nyocha ihe a MTN mere kemgbe afọ itoolu gara aga, ma gaa n'ihu degara ngalaba ụlọọrụ ahụ nke nọ Naijiria akwụkwọ na-ekwu ka ha kwụghachi ijeri dọla 8.134 na egbughị oge.
CBN dakwara ụlọakụ anọ MTN siri n'aka ha bupụ ego ndị a ahụ site n'afọ 2007 rue 2015 nha ma gwa ha ka ha kwụghachi ijeri dọla 8.134.
Ụlọakụ anọ ndị ahụ bụ Stanbic IBTC Bank Limited, Citibank Nigeria Limited, Standard Chartered Bank, na Diamond Bank.
Cheta na n'afọ atọ gara aga, a dara MTN nha ijeri naira 333 maka ịhapụ igbubi akara ekwenti ndị e debanyeghị aha ha n'akwụkwọ.
MTN akwụọla ijeri N165 n'ime ego ahụ.
Akụkọ ga-amasị gị:





