Nsogbu 9mobile: Teleology akwụọla nde $50 iji zụta

Teleology Holdings ritere uru ị bụ ndị nwere isiọma izụ 9mobile n'ụbọchị nke iri abụọ na anọ nke ọnwa Febụwarị afọ a.
Enyere ụbọchị taa ka ha kwụnye ego ahụ, maọbụrụ na ha akwụnwụ ya, a ga-akpọ ụlọọrụ, Smile Telecoms Holdings, ka ha wegharịa 9mobile.
Dịka Teleology kwurula ego nke mbụ, a na-atụ anya na ha kwụ nke fọrọnụ bụ nde $500 n'ime ọnwa atọ na-abịa iji nwere 9mobile kpamkpam.
Akụkọ kwuru na Teleology si na Keystone Bank kwụọ nde $50, ebe United Capital Trustees Ltd na United Bank for Africa (UBA) Plc ga-erite uru na ya.
Teleology meriri ụlọọrụ ekwenti dịka Bharti Airtel, Globacom na Alheri nke Dangote nwe iji nweta ikikere ịzụ 9Mobile.

Akụkọ ga-amasị gị:

Onye bụbụ onyeisi MTN na Naịjirịa mabụrụ onye du ndị Teleology tinye ọnụ n'okwu ịzụ 9mobile bụ Adrian Wood kwara ụlọ akụkọ Thisday na ndị otu ya nwetara ego ahụ ma kwụnye ya na ụlọakụ United Capital Trustees na UBA.
Wood kọwara na ndị niile ọ gbasara etinyela aka n'akwụkwọ.
"Dika etinyerela aka n'akwụkwọ mbibi a gbara, Teleology ga-akwụghachị ụgwọ 9mobile iji ụlọakụ iri na atọ, ebe ha ga-enye ya atụmatụ ịkwụghachị ha.
"Nke a pụtara na 9mobile agaghị enwekwa ụgwọ ọbụla n'akwụkwọ ha n'ihi na Teleology akwụchala ha niile. Nke a pụtara na 9mobile ga-enwe ụgwọ mbibi dịka onye so nwere oke n'ụlọọrụ ahụ."










