Evans: abụghị m onye ntọ

Evans

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Chukwudumeme Onwuamadike a.k.a Evans bụ onye a na-enyocha maka ntọ ndị ji ego na Naịjirịa

Okwu pụtara n'ụlọikpe ukwu dị n'Ikeja, Lagos .ụbọchị Tuusde n'eme ọtụtụ mmadụ dịka ihe a na-ahụ na nrọ maọbụ ihe a na-ahụ n'ihe nkiri Nollywood.

Nwoke ahụ ndị uweojii na-ebo ebubo onye ntọ bụ Chukwudumeme Onwuamadike bụkwa onye a ma ama dịka Evans kwuru n'ụlọikpe na Tuusde na o nweghị mgbe ọbụla o jiri ọnụ ya kwupute na ya bụ onye ntọ.

Anya na ọnụ ndị mmadụ ka meghera oge Evans kwukwara na akwụkwọ nkwupụta ahụ ndị uweojii kwuru na o dere abụghị eziokwu.

Egwu a gwara ọgwa a Evans gbara malitere oge ọkaiwu Adebayo Haroun wepụtara akwụkwọ nkwuputa Evans dịka akaebe na Evans bụ onye ntọ.

Ndị ọzọ ha na-ebo ebubo na ha na Evans nọ n'otu ndị ntọ bụ Uchenna Amadi, Okwuchukwu Nwachukwu nakwa Ogechi Uchechukwu gọkwara na ha abụghị ndị ntọ dịka ndị uweojii siri kwuo.

Mana okaiwu na-anọchite Evans bụ Chino Obiagu juru cha cha na ihe nkiri gosiri ebe Evans na-ekwupụta na ya bụ onye ntọ agaghị abata dịka akaebe na ya bụ ikpe.

Otu uweojii Idowu Haruna gwara ụlọikpe ahụ na o dere akwụkwọ nkwuputeaEvans maka na Evans kwuru na ọ gụchasịghị akwụkwọ sekọndari.

Haruna kwuru na ihe Evans kwuru ụbọchị ahụ bu na ọ bụ onye ntọ, ya bụ ihe o dere n'akwụkwọ nkwupụta ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị