NCDC: Anyị na ụlọọrụ ahụike UK na-enyocha mmadụ abụọ bụbara ọrịa 'monkeypox' na Britain

Ebe foto si, Getty Images
Kamgbe a chọpụtara mmadụ abụọ na-arịa ọrịa 'monkey pox' na London, ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa a kpọrọ "Nigeria Centre for Disease Control" nakwa ụlọọrụ ahụike na-enyocha ya bụ ọrịa.
NCDC kwuru na ha na ndị ọchịchị steeti dị iche iche na Naịjirịa jikọtara aka inyocha ma gbochie ya bụ ọrịa "Monkey pox" ịgbasasị n'obodo.
NCDC kwukwara na ha na otu dika WHO, UNICEF nakwa ndị ọzọ na-ahụ maka ahụike mbaụwa niile na-ezukọ izuụka ọbụla iji wepụta ụzo dị iche iche a ga-esi gbochie ya bụ ọrịa "Monkey pox".
Gini bụ Monkey pox
- Ọ na-esi n'anụmanỤ fee mmadụ.
- Ọ na-ebu ahụ ọkụ, isi ọwụwa, ahụ ụfụ, mgbaka akpịrị na ọkọ ahụ abịa.
- Ihe ndị a nwereike ime gị ruo izuụka abụọ maọbụ anọ.
- Ọ naghị eji ike agbasasị n'ahụ ndị mmadụ maọbụ n'ọha ebe igwe mmadụ nọ.
Dịka NCDC si depụta n'akwụkwọ ozi ha wepụtara nso nso a, ọ na-adị mkpa ịkpachapurụ ndị nọ n'ọnọdụ a anya ma mee ka ndị mmadụ na-adị ọcha site n'iwere mmiri na ncha kwọọ aka.
Ụlọọrụ NCDC kwukwara na ha ga-eme ihe niile ha nwereike ime iji wee hụ na ha nyochara ma chọpụta ndị bu ya bụ ọrịa "Monkey pox".
Ha rịọro ka onye ọrụ ahụike ọbụla chọpụtara onye bu ọrịa "Monkey pox" gwa ndị na-arụ n'ụlọọgwu na-ahụ maka anụahụ na steeti ahụ ka ha wee mara ihe ha ga-eme.
NCDC nyere akara websait a ''https://ncdc.gov.ng/diseases/guidelines.'' dika ebe mmadụ nwereike ịga nweta etu ọ ga-esi gbochie maọbụ gwọo ọrịa "Monkey Pox."









