Ọnụọgụgụ ndị ebola na-egbu na Congo ka na-arigo
Akụkọ ndị kachasị mkpa taa:
Ebola:

Ebe foto si, Getty Images
Na Congo, ebola egbuola ihe ruru mmadụ iri ise na ise dịka ndị ọrụ ahụike ha si kwuo,
Ebe ihe ruru mmadụ iri anwụọla na mba Italy ka idemmiri buuru ha na mpaghara Calabria.
Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari mere ihe tụrụ ndị mmadụ n'anya ka o ji ụkwụ gaa ihe ruru kilomita narị asatọ taa.
O rituru sonye ndị ji ụkwụ na-aga maka na ndị na-akwado ya nọchichara ụzọ gbochiri ụgbọala ya igafe ka o si ebe ọ gara ekpere maka Sallah na-ala n'ụlọ ya na Daura.
Ọganiihu ndị Aba
Ndị na-arụ akpụkpọ ụkwu n'ahịa arịarịa dị n'Aba gwara BBC Igbo na ọ bụrụ na e nye ha ohere, na ha ga-arụ akpụkpọ ụkwụ ndị Naịjirịa niile ga na-eyi.
Ha kwukwara na ha chọrọ enyemaka gọọmentị inweta ngwaọrụ na ihe ndị ọzọ ha ji arụ ọrụ.
N'egwuregwu,
David Beckham wụsara akpụkpọ ụkwụ o ji agba bọọlụ n'afọ 2013, ga-enweta nturuugo n'aka otu UEFA.

Ebe foto si, Getty Images
Beckham ga-enweta nturuugo onyeisi UEFA maka onyinye ọ nyere egwuregwu bọọlụ nakwa etu o si akwado bọọlụ n'akụkụ ụwa niile.
Gere akụkọ mere na mgbede a n'otu nkeji:
Ihe nkiri nke taa:
Na agbanyeghị nsogbu dị n'etịtị ndị obodo ọzọ dị na Naịjirịa na ndị Fulani na-achi ehi, Akwuke na ndi na-achị ehi na-ebi n'udo.











