Presidential election Tribunal: Buhari emeriela Atiku n'ikpe onye meriri ntuliaka 2019

Ebe foto si, @Atiku/@MBuhari
Ụlọikpe akpụla akwụkwọ Atiku Abubakar gbara Buhari n'ụlọikpe pụrụ iche onye meriri na ntụlịaka onyeisiala Naijiria nke afọ 2019.
Ndị ọkaikpe mmadụ ise nke onye ndu ha bụ Jọstịs Mohammed Garba kwuru na akwụkwọ akaebe niile ndị gbara akwụkwọ wepụtara iji kwado ebubo ha boro dịka na atụụ vootu karịrị ndị tụrụ ya egosighị.
Ụlọikpe ekpebikwara na Inec ejighi "server" gbakọọ mpụtara ntuliaka ahụ n'akwụkwọ Atiku Abubakar nke PDP gbara Onyeisiala Muhammadu Buhari n'Abuja ụbọchị Fraide.
Ụlọikpe kwukwara na Osinbajo ejighi ' Tradermoni' zụọ vootu ndị mmadụ ma kwụkwaa na Buhari gụ®ụ aakwụkwọ tozuru ịbụ onyeisiala
Onye fere ọkọlọtọ "People's Democratic Party" (PDP) bụ Atiku Abubakar na ntuliaka ahụ gbaburu Onyeisiala Muhammadu Buhari akwụkwọ na-agbagha mpụtara ntuliaka ahụ e mere n'abali 23 nke ọnwa Maachi.
Atiku sị na ọ bụghị Buhari nwe mmeri na ya bụ ntuliaka.
Dịka ngalaba na-ahazi ntuliaka bụ Independent National Electoral Commission (Inec) siri kwupụtabu, Buhari nwetara vootu dị 15,191,847 nke pụtara pasenti 56, ebe Atiku nwetara vootu dị 11,262,978 nke pụtara pasenti 41 vootu a tụrụ.
Mana Atiku wepụrụ okwu ahụ ụlọikpe pụrụiche e hiwere maka ntuliaka ịgbagha ya bụ mpụtara.

Ihe atọ Atiku na PDP sị na ha chọrọ ka ụlọikpe kpebie
- Ma Buhari otozuru ịzọ ọchịchị dịka onyeisiala Naịjirịa n'afọ 2019, nakwa ma asambodo onyere Inec iji gaa akaebe na ya tozuru onwere asị o ji nyere onwe ya aka itozu isonye na ya bu ntuliaka.
- Ma mmeri Buhari o si na vootu atụrụ n'ezi n'ime ya bụ ntuliaka, nakwa ma ntuliaka a na etu Inec ji hazie ya ọ ga-akwụnwụ dịka ihe iwu nabatara.
- Ma ntuliaka 2019 ọ ga-akwu agbanyeghi na usoro eji me ya akwadoghi iwu ntuliaka nke afọ 2010 nakwa usoro ime ntuliaka 2019 nakwa akwụkwọ ntụzịaka ebiputere maka ntuliaka.

Atiku na pati ya bụ PDP boro ebubo na ha nwere ihe akaebe gosiri na e mere wuruwuru dị egwu na ntuliaka ahụ na mpaghara dị iche iche na Naijiria.

Ha kporo oku ka a gbaa n'anwụ ngụkọ dị na 'server' Inec ka pati ọbụla mara ebe ha kwụ dịka ha na-ekwusi ike na ọ bụghị ihe Inec kwupụtara bụ ihe a tụtara na vootu.
Ọzọ, Atiku gbaghakwara sị na Buhari enweghị agụmakwụkwọ tozuru ya ịbụ onyeisiala.
Iwu Naijiria nke afọ 1999 akụkụ nke 131 kwuru na onye ga-abụ onyeisiala ga abụ : "Onye gụrụ opekata mpe 'school certificate' maọbụ oyiri ya."
Mkpebi abụọ nwereike sepụte isi taa
Okwu Server
N'ụbọchị 21 nke ọnwa Ọgụstụ Ụlọikpe Ukwu Naịjirịa kagburu atụmatụ PDP inyocha igwe "server" Inec.
Ndị Ọkaiwu ise nọ na ngalaba a Dattijo Muhammad bu onyeisi ha sị cha cha ma ncha na ha agaghị ekwe n'arịrịọ PDP na onye zọrọ ọchichị n'okpuuru ha bụ Atiku Abubakar maka ihe ndị ọzọ metụtara okwu "server" a.
Na mkpebi ha, Ụlọikpe a sị na Inec agọọla na ha enweghị "server" ma kwukwa na ha ejighị usoro tecknuzu ọbụla kpokoo ọnụọgụgụ vootu gaa "server" ọbụla dịka PDP na Atiku siri kwuo.
Okwu etosughi ịzọ ọchịchị
N'ikpe metụtara Buhari itozu ịzọ ọchịchị ụlọikpe Mkpegharị dị n'Abuja nọrọ n'ụbọchị Fraide bụ ụbọchị asaa nke ọnwa Ọgọstụ 2019 kụpụ n'akụkụ, akwụkwọ a gbara na-ekwu na Buhari agụrughị akwụkwọ ịbụ onyeisiala na ntuliaka 2019.
Na mkpebi ụloikpe nke ọkaikpe atọ n'isi ya Jọstis Mohammed Idris kwuru na a gbara akwụkwọ ahụ mgbe ọ gaferela oge kwesịrị ka e weta ya bụ okwu n'ụlọikpe nke bụ abalị iri na anọ.
Kalu Kalu, Labaran Ismail and Hassy El-Kuris gbaburu akwụkwọ n'ụlọikpe ukwu dị n'Abuja iji gbaghaa na Buhari etozughị ịbụ onyeisiala. mana ụlọikpe ahụ kụpụrụ ya, ha were gbagharịa akwụkwọ ahụ n'ụlọikpe mgbegharị.
Amabeghi ma nke ahụ ọ ga-emetụta ikpe nke taa.
Ndị Ọkaikpe gbara mgba n'ụlọikpe maka ikpe a
- Yunus Usman (SAN) du ndị nọchitere anya Inec
- Wole Olanipekun (SAN) bụ onyeisi ọnụ dị kpere Buhari
- Chief Charles Edosomwan (SAN) nọchitere anya pati APC
- Chris Uche (SAN) nọ n'isi ndị nọchitere anya Atiku.













