Buhari ekweela ndị nso ya nkwa ọhụrụ maka ntuliaka 2019

Ebe foto si, @Buharicentre/Twitter
O kwruru nke a mgbe ekpokọbara otu ndị nkwado ọhụrụ ya akpọrọ "Together Nigeria" na-agba mbọ ịhụ na o meriri ntuliaka 2019.
N'ọnụ ya "a nam ekwe onye ọbụla rụsiri ọrụ ike ịhụ na m banyere ọkwa onyeisiala na 2019 nkwa na m ga-akwụghachị ha ụgwọ"
O kwuru na ọ gaghị adị ka afọ 2015 ọzọ ebe ndị mmadụ kwadoro ya na mmeri enwetaghị ihe ọbụla.
Ndị nọ na mmemme a gụnyere nwunye ya bụ Aisha Buharị nakwa nwunye Osinbajo bụ Dolapo Osinbajo nakwa gọvanọ steeti dị iche iche.
Mohammed Kazaure nọkwa na mmemme a kwuru na ọ bụrụ na enye Buhari afọ anọ ọzọ, ọ ga-emekarị ihe o meburu na mbụ.
N'agbanyeghị nke a, ndị ibe ya so ya binye aka n'akwụkwọ 'Peace Accord' bụ Atiku Abubakar na Oby Ezekwesili akpọọla ya ka ọ binyekwa aka na iwu ọhụrụ ga-agnamwe ntuliaka 2019.
Ọzọ,

Ebe foto si, Doyin Okupe/Facebook
Ngalaba na-ahụ maka mpụ na nrụrụaka ego bụ EFCC n'aha ịchafụ atọghapụla Doyin Okupe bụbu onye ndụmọdụ onyeisiala gara aga bụ Goodlcuk Jonathan.
EFCC nwụchiburu Okupe make ebubo ịbupu ego nakwa ihe ndịọzọ o mere n'okpuru Jonathan.
Na mba ofesi,

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala mba Briten bụ Theresa May ka kwụsị ịke dịka o jiri vootu narị abụọ na-akwado ya merie vootu otu narị na iri n'asaa ndị anaghị akwado ya n'abali wensde.
O kwuola ugbua na ọ ga-aga n'ihu ị wepu mba briten n'ọgbakọ Yurop.
N'Egwuregwu,

Ebe foto si, Getty Images
Dịka asọmpị Champions League na-ekpo ọkụ, otu CSKA Moscow ji ọkpụ goolu atọ asataghị otu dọọka neeti otu ReaL Madrid dịka Valencia ji ọkpụ gọọlụ abụọ merie otu Manchester United.
Gee Nkeji nke ụtụtụ a:
Ihe onyonyo nke taa
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị











