ASUP strike: "Gọọmentị emezubeghị nkwa ha kwere anyị"

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Akụkọ dị mkpa

Otu jikọrọ ndị nkuzi na-arụ n'ụlọ akwụkwọ dị elu nke Politeknik bụ ASUP n'aha ịchafụ amalitela abụbụọrụ.

Ụmụakwụkwọ na-ala maka abụbụọrụ

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ha bụ Usman Dutse, gwara BBC na ọ bụ makana gọọmentị etiti emezubeghị nkwekọrịta ha nwere n'afọ 2009 nakwa 2017.

Minista agbaala arụkwaghịm

Minista Naịjirịa na-ahụ maka gburugburu bụ Ibrahim Jubril awụsala ọwa n'ọrụ ya, sị na ọ naghị arụzị.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Iwu ala machiri idina mmadụ n'ezi

N'agbanyeghị akụkọ na-efegharị nke na-ekwu na ọ dịghị n'iwu, kọmishọna ndị uweojii na Legọs bụ Edgal Imohimi, ekwuola na iwu Naịjirịa machiri nwoke na nwaanyị idina onwe ha n'ọha, ma kwuo na o nwere ike ịkpọga gị nga afọ abụọ na ụma.

Na mba Brazil,

Otu nwoke a kpọrọ Euler Fernando Grandolpho agbagbuola mmadụ anọ tupu ọ gbagbuo onwe ya n'ime ụlọụka Metropolitan Cathedral dị n'obodo Campinas.

Ụlọụka Metropolitan Cathedral

Ebe foto si, EPA

Nkọwa foto, Ụlọụka Metropolitan Cathedral ebe a Grandolpho gbagburu mmadụ anọ

N'egwuregwu,

N'agbanyeghị na a na-enyocha ụfọdụ ndị na-akwado otu Chelsea maka ịkpaso onye egwu Manchester City bụ Raheem Sterling oke agbụrụ, ọ ka na-enwuke ka ugo.

Raheem Sterling

Ebe foto si, Getty Images

Ndị otu Premier League nyere Sterling nturuugo "ọkachasị agba na Premier League nke ọnwa Nọvemba" nke mere ya ugboro abụọ ọ na-enweta nturuugo a.

Dike Igbo alaa mmụọ

Ikenga Nnewi

Ndị mmadụ apụtala ị kwanyere onye bụbu onyeisi Ohaneze Ndigbo nakwa dọkịnta amaama bụ Dozie Ikedife ugwu ikpeazụ n'ọnwụ ya.

Dozie Ikedife dị afọ ira asatọ n'asatọ nwụrụ ụnyaahụ

Ọzọ,

Akwụkwọ udo
Nkọwa foto, Akwụkwọ udo ga-eme ka ndị na-azọ oche ọchịchị kwe nkwa na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi udo obodo na ntuliaka na-abịanụ

Ndị mmadụ na-ajụ ebe Oby Ezekwesili, Donald Duke nakwa Atiku Abubakar bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala Naịjirịa nọ ụnyaahụ dịka onyeisiala Muhammadu Buhari binyere aka na nkwekọrịta udo maka ntụliaka 2019.

MASSOB

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu MASSOB na-achọ ka gọọmentị etiti gere ha nti n'ọchichọ nwereonwe ha

Uchenna Madu bu onye ndụ otu MASSOB apụtala ịkwu na o nweghi onye nwere ikikere ịgbochi ndigbo ịlaghachị ala Igbo maka ntụlịaka n'afọ 2019.

Nke a na-abịa dịka otu akporo IDA n'aha ịchafụ nyere iwu na a ga-ada onye ọbụla nara ala Igbo, ọ kachasị ndị bi n'ugwu awụsa nha ma ha laghachị ala igbo na ntuliaka n'abịa.

Na mba ofesi,

Ndị uweojii Strasbourg

Ebe foto si, Reuters

Na mba ofesi ndị uweojii na mba Fransi na-achụ otu nwoke ji egbe wakpo ndị mmadụ n'ahịa ekeresimesi n'obodo Strausbourg.

Ha kwukwara na mwakpo a tara isi mmadụ atọ ebe mmadụ iri n'abụọ ndị ọzọ merụrụ ahụ na-anata ọgwụgwọ ugbua.

Gee Nkeji nke ụtụtụ a:

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile