Atiku, Ezekwesili ebinyela aka n'akwụkwọ 'Peace Accord'

Buhari,Ezekwesili na Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Onye na-azọ oche onyeisiala n'okpuru pati PDP bụ Atiku Abubakar nakwa onye ogbo ya nke ACPN bụ Oby Ezekwesili ebinyela aka n'akwụkwọ nkwekọrịta ụdọ na ntuliaka 2019.

Atiku na Ezekwesili mere nke a ụbọchị Wenezde oge ha gara(iche iche) n'ụlọọrụ National Peace Committee dị n'Abuja.

Cheta na Mmadụ abụọ a kwuburu na e ziteghị ha ozi bịa ọgbakọ maka mbinyeaka aka na nkwekọrịta i mee ka udo chịa na ntuliaka na-abịanụ.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Mana otu kpokọbara maka ya bụ mbinyeaka zọrọ isi onwe ha kwuo na ha zigara ndị na-azọ oche onyeisiala ruru iri asaa na atọ n'ime pati iri itoolu na otu ozi.

Gịnị dị n'ime akwụkwọ 'Peace Accord' a?

Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị oru ya bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 kwetara;

  • Na ha na ndị otu ha agaghị eme nkwado ọbụla ga-ebute nkewa n'etiti ndị mmadụ site n'agbụrụ nakwa chi ha na-ekpere.
  • Na ha agaghị ekwu okwu ọbụla maọbụ nye ozi ọbụla ga-ebute ọgbaghara tupu maọbụ e mechaa ntuliaka 2019.
  • Na ha ga-enye onwe ha n'aka otu na-ekpokọba bụ National Peace Committee maka ezi nyocha
  • Na ha ga-akwado ngalaba gọọmentị etiti niile n'ime ka ihe niile dị nhatanha
  • Na ha ga-ekwuputa okwu megide onye ọbụla butere ọgbaghara na ntuliaka ebe ọbụla o mere.

Onyeisiala Muhammadu na ụfọdụ ndị otu pati ndị ọzọ binyere aka na ya bụ akwụkwọ udo ma na-ekwe nkwa na ọ ga-agba mbọ hụ na ihe gara nkeọma na ntuliaka na-abịanụ.

Akwụkwọ udo
Nkọwa foto, Akwụkwọ udo ga-eme ka ndị na-azọ oche ọchịchị kwe nkwa na ha agaghị eme ihe ọ bụla ga-emebi udo obodo na ntuliaka na-abịanụ

Akwukwọ nkwekọrịta udo ma a na-eme ntuliaka na 2019 gụnyere na onye ọbụla na-azo oche ọchịchị agaghị eme ihe ọ bụla ga-ewepụ udo n'obodo.

Ha kwekọrịta na achụm nta vootu ha ga-abụ ihe wulite mmụọ ụmụ Naịjirịa ma gwa ha etu ha ga-esi gbanwe ọnọdụ ha ma ha banye ọchịchị.

"N'ime nkwa a anyị na-ekwe, anyị agaghị akatọ okpukpe onye ọbụla anyị na ya na-azọ oche ọchịchị."

Gịnị dị n'ime akwụkwọ 'Peace Accord' a?

Onyeisiala Muhammadu Buhari na ndị oru ya bụ ndị na-azọ ọkwa onyeisiala na 2019 kwetara

  • Na ha na ndịotu ha agaghị eme nkwado ọbụla ga-ebute nkewa n'etiti ndị mmadụ site n'agbụrụ nakwa onye ha na-ekpere.
  • Na ha agaghị enye okwu ọbụla maọbụ ozi ọbụla ga-ebute ọgbaghara tupu maọbụ emechaa ntuliaka 2019.
  • Na ha ga-enye onwe ha n'aka otu ekpokọbara bụ National Peace Committee maka ezi nyocha
  • Na ha ga-akwado ngalaba gọọmentị etiti niile n'ime ka ihe niile dị nhatanha
  • Na ha ga-ekwuputa okwu megide onye ọbụla butere ọgbaghara na ntuliaka ebe ọbụla ọ mere.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: