Judaism: Ndị Ipob na ndi okpukpere Juu mere ngagharịiwe n'Abia

Ndị na-ekpe okpukpere Juu

Ebe foto si, Getty Images

Ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela ndị okpukpere Juu mmadụ n'Umuahia maka ikposa obodo.

Ọgbaghara dara n'ehihie ụbọchị Tuzde ka igwe ndị okpukpere Juu jupụtara n'okporoụzọ na-eme ngagharịiwe na-ekwu ka e nye ha Biafra..

Ndị nọ n'ebe ihe mere kwuru na ndị uweojii jiri anwụrụ anyammiri (teargas) chụsasịa ndị ahụ ji uwe nwụda ọcha, ma nwụchịkwa ụfọdụ n'ime ha.

Mana ha gbasara ma lọghachikwa ọzọ, ebe ndị uweojii sochikwara n'ike. ma gaa n'ihu ịgba ha anwụrụu anyamiri.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Abia steeti bụ Godfrey Ogbonna gwara BBC Igbo na ngaghariiwe ahụ mere n'ezie.

Mana o kwuru na ọ bụ ndị Ipob kwunyere ndị okpukpere Juu were mee ngagharịiwe.

Ọ gara n'ihu kwuo na ha anwụchiela ụfọdụ n'ime ndị mere nke a, ebe ha nwetara ihe njirimara otu Ipob gụnyere ọkọlọto Biafra.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: