Uche Nwosu: 'Ewereghikwa m ala onye ọbụla aka m dị ọcha'
Uche Nwosu bụ onye na-efe ọkọrọtọ ndị Action Alliance na ntuliaka 2019, kwuru na enweghi mgbe o ji kpara ala ndị mmadụ.
O kwukwara na onye ọbụla ma ebe ala a na-ekwu na ọ kparala dị, bịa gosi ya.
Maka ụlọ oriri na nkwari a sị na o nwere, ọ sị “ọ bụrụ na ha sị na ọ bụ m nwe Immaculate Hotel a, Chineke biko ekpere m na-ekpe bụ ka ị nye m ego, nye m ndụ ka m rụta ya.”
Akụkọ ga-amasị gị: