Uche Nwosu: 'Ewereghikwa m ala onye ọbụla aka m dị ọcha'

Aha onyonyo, Uche Nwosu: 'Akparaghị m ala ndị mmadụ, aka m dị ọcha'

Uche Nwosu bụ onye na-efe ọkọrọtọ ndị Action Alliance na ntuliaka 2019, kwuru na enweghi mgbe o ji kpara ala ndị mmadụ.

O kwukwara na onye ọbụla ma ebe ala a na-ekwu na ọ kparala dị, bịa gosi ya.

Maka ụlọ oriri na nkwari a sị na o nwere, ọ sị “ọ bụrụ na ha sị na ọ bụ m nwe Immaculate Hotel a, Chineke biko ekpere m na-ekpe bụ ka ị nye m ego, nye m ndụ ka m rụta ya.”

Akụkọ ga-amasị gị: