Uche Nwosu: Ihe Oshiomole mere agaghị akwụsị m n'Imo steeti
Onye na-ele anya ịzọ ọkwa gọvanọ n'Imo steeti bụ Uche Nwosu, kwuru na ọ bụ ndị ụlọikpe Naịjirịa ka ọ dị n'aka ikwu onye ga-anọchite anya APC.
O kwuru na pati enweghị ikike ịgwa ya rituo n’oche, makana ọ bụ ya nwetara mmeri na ntuliaka imeụlọ ha mere.
O kwukwara na tupu e ruo ngwụcha Nọvemba mgbe a ga-amalite ịchụ nta vootu n'ime obodo, na ha ga-ama ihe iwu obodo ga-ekwu maka onye ga- anọchite anya APC Imo steeti.