EFCC: Ụmụ T.A. Orji ka anyị na-enyocha

EFCC
Nkọwa foto, Otu onye omeiwu a chụrụ n'afọ gara aga bụ Abdulmumin Jibrin bụ onye degara EFCC akwụkwọ gbasara mpụ ahụ

Ọnụ na-ekwuru EFCC bụ Tony Orilade ewepụtala akwụkwọ ozi na-ekwu na ọbụghị na-ezie na ha na-achọ ụmụ Atiku Abubakar bụ onye ji aha PDP azọ ọkwa onyeisiala.

EFCC sị na ọtụtụ mmadụ na-ajụ ha ajụjụ ịmata ma onwere ka ha sị jide ụmụ Atiku Abubakar ịchọ ma o nwere ego mba ofesi ha ji ike dị.

N'okwu a, "nke bụ akụkọ na egwu. Onweghi eziokwu tọgbọ n'ime ya".

Ha kwukwara na-ọtụtụ mmadụ amarala n'ụlọọrụ EFCC na-enyocha aka chiburu Abia Steeti bụ Theodore Orji bụ nke a na-ebo ebubo buuru ọkpụrụkpụ ego dị ijeri naịra iri abụọ na asaa (N27b).

Okwuru na, "Ka anyị na-eme nnyocha a, anyị chọpụtara na ụfọdụ ego ndị ahụ sị ụmụ ya n'aka gafee".

EFCC na-enyocha ọtụtụ ihe ọdị ha ka ha eji ego ndị a zụta nke gụnyere ụgbọala.

"Fraịde gara aga anyị chụrụ otu n'ime ugboala ruo n'ụlọ oriri na nkwari dị n'Abuja", dịka ha dere na-akwụkwọ a.

Ha sị na ha mechere kpụrụ Ogbonna Orji gbara afọ 32 bụ onye bu ụgbọla Range Rover a na-ere otu nde narị naịra (N100 m) na ogbo ya bụ Kelvin Ilonah bụ onye bukwa ụgbọla Range Rover a na-ere nde iri atọ na ise (N35 m).

Ka ha na-agba mmadụ abụọ a ajụjụ ọnụ ka ha kpọgara ha ebe ha bi bụ ebe ha na-akwụ ego dị nde naịra iri na atọ (N13 m) kwa afọ.

Ha chọpụtakwara ụgbọla ọzọ bụ Prado Jeep 2017 bụ nke dị n'ebe ha.

EFCC sị na mmadụ abụọ gbakwara ama nke na-enyere ha aka na nchọpụta ndị ọzọ.

Akwụkwọ ahụ dere na, "Ụmụ Atiku esoghị ndị ejidere".

Ndị ụlọọrụ ahụ jikwa ohere ahụ gọrọ aka ha n'ebubo eboro ha izu gara aga maka ịkpọchị ọbaego Peter Obi.

Ha sịkwa na-eziokwu atọgbọghị na nka ma ọlị.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: