Buhari asaala nwunye ya okwu?

Ebe foto si, Getty Images
N'ime akwụkwo ozi Buahri deputara site n'onye enyemaka ya bụ Garba Shehu, o kelere ndị mmadụ maka nkwado ha nyere ya.
Ọ gwara ndị mmadụ na n'ime asọmpị ọbụla a na-enwe ndị mmeri na ndị emeriri. O kwukwara na ọ dịmma ka ndị emeriri nabata ya n'ebughi ihe ọjọọ ọbụla n'obi ha.
N'ọnụ ya "ṅomie nu Ambode onye apụghị na patị n'agbanyeghị na emeriri ya na ntụlịaka imeụlọ steeti ya"
Ọ gwara ndị meriri ha gba mbọ jiri ọkwa ha mee ka ndụ dịrị mmadụ niile mma.
Cheta na nwunye ya bụ Aisha Buhari wuru ewu n'ụtụtụ a maka nkatọ ọ katọrọ usoro eji azọ ọkwa ọchịchị.

Ebe foto si, @BashirAhmaad
Onyeisioche otu APC bụ Adams Oshiomhole bụ onye kpọpụtara aha onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye ga-azọ ọkwa onyeisiala n'aha pati ha na ọgbakọ ukwu pati ahụ nwere n'Eagles Square, Abuja.
Buhari nwetara vootu 14,842,072 bụ ọnụọgụgụ otu ahụ aha ha dị n'akwụkwọ pati ahụ,ebe ndị nnochiteanya biara ọgbakọ ukwu ahụ dị mmadụ 7,000.

Okwu nnabata Buhari
N'okwu iji nabata mkpọpụta ahụ, Buhari kerele ndị isi pati ahụ, ndị nhazi ọgbakọ ahụ,nakwa ndị hapụrụ ya ọkwa ahụ maka ọdịmma nke pati ha.
Ọ gụkọrọ ihe ọma niile ọchịchị ya merela kemgbe 2015`nke ọ gụnyere ibu agha megide nrụrụaka, imeri Boko Haram na ịrụ maọbụ irụzị okporoụzọ, ma kwe nkwa mmeri na 2019.
"Obi dị anyị mma na ihe ndị anyị merela site na afọ 2015 rue ugbua.
" Anyị agbala mbọ iweghazị ọnọdụ nchekwa na akụnụba Naijiria na-emilabu.
"Nsogbu Boko Haram ebelatala. Udo aloghachiela na Ugwu na agbataobi anyịọ na mba ndị ọzọ eze ha na-akpabu ike.
"Ego dị n'akpa anyị agbalitela ruo Ijeri dọlaza 44 nke ka ihe anyị kwudoro na 2015.
"Ọkụlatrik nọzị na 8000megawat ebe ọ bụbu 4600 megawatt."
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mmadụ naanị maadụ puku asaa binyere aka na ntuliaka

Ọ bụghị naani otu pati na-eme ọgbakọ ukwu ha taa, otu APC ga-emekwa nke ha n'abali ụbọchị isii nke ọnwa October .
Ọ bụ mmadụ ruru puku asaa ga-ebinyeaka n'akwụkwọ ntuliaka imeụlọ a.
Naani otu onye na-azọ oche onyeisiala n'ọgbakọ ukwu APC. Aha ya bụ Muhammadu Buhari.

Ụfọdụ n'ime a nọrọla ebe a na-eme ya bụ ntuliaka bụ Eagles square dị n'Abuja.
Paul Ikonne bụ otu n'ime ndị chọrọ ịzọ ọkwa Gọvanọ n'okpuru APC n'Abia steeti ekwuola na nrụrụaka abanyela n'usoro ntuliaka imeụlọ ha.
O boro ụfọdụ ndị pati ebubo na ha denyere aha ụfọdụ ndị esoghi n'awkụkwọ ndekọ ha ji si Abuja bịa.
N'ime ndị ọ kpọrọ aha mere mpụ a bụ Orji Uzor Kalu bụ aka chịbụrụ Abia steeti.
Onyeisioche APC na Abia steeti Donatus Nwamkpa kwuru na ọ bụghị ya ga-asa Paul Ikonne, na ọ bụ onye ndu komịtị ehibere maka ntuliaka a ga-asa ya okwu.

Kedụ nkewa nke na-ekwu eziokwu n'APC Imo steeti?
FCC Jones bụ onye odeeakwụkwọ mgbasaozi APC n'Imo steeti gwara BBC Igbo na ntụlịaka imeụlọ n'Imo steeti nke a kpọrọ 'Primaries' na Bekee dị njikere ịme taa.
O kwuru na a hụbeghị Ahmed Gulak bụ onye kwesiri ịhazi ma nyochakwa ya bụ ntuliaka.
N'aka nke ọzọ Theo Ekechi si n'agba ọzọ n'ime nkewa nke dị n'APC kwuru na Ahmed Gulak nke a na-acho achọ arụchala ọrụ dịrị ya laghachi Abuja.
Ọnụ na-ekwuchitere Eze Madumere bụ Uche Nworah gwara BBC Igbo na onweghi ntụlịaka ọbụla na-eme taa.
O kwuru na n'uche ha, e meela ya bụ ntụliaka ụnyaahụ.
N'Abia: Ngwaọrụ atụọla na Abia steeti
Ngwaọrụ a ga-eji mee ntụlịaka imeụlọ nke APC n'Abia steeti erutela n'ọgbo ebe e kwesiri iji ya mee ihe.


Akụkọ ga-amasị gị











