Chimamanda Adichie na-eduhie ụmụagbọhọ anyị- Atuejide

Atuejide na Chimamanda

Ebe foto si, Getty Images na Atuejide

Nkọwa foto, Atuejide ekwenyechaghị n'okwu ufọdụ Chimamanda na-ekwu

Eunice Atuejide so na ndị na-azọ oche onyeisala Naịjirịa ekwuola na okwu Chimamanda Adichie na-ekwu ụfọdụ oge na-eduhie ụmụagbọghọ.

O kwuru nke a mgbe ọ na-aza ajụjụ ọnụ onye ntaakụkọ akpọrọ Daddy Freeze na-agba ya n'elu igwe okwu.

Ihe o kwuru, "E chere m na Chimamanda na-emebiga ihe oke, e chekwaram na-eduhie ọtụtụ ụmụagbọghọ Naijirịa."

"Ọ bụghị mgbe niile ka na-ekwenye n'ihe ọ na-ekwu makana ụfọdụ oge ọ na-tụ m n'anya okwu na-esi n'ọnụ ya apụta."

Atuejide kwuru na ọ na-eche na ọ bụghị mgbe niile ka ụmụagbọghọ ga na anabata okwu niile Chimamanda kwuru makana ọ ga na-emegide ha echi.

Kamgbe o kwuchara okwu a, ndị mmadụ na soshal achịrị na ọkụ so ya, ebe ụfọdụ kwenyere n'ihe o kwuru.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: