EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere

Aha onyonyo, EEDC: Gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwere

N'okwu gọọmentị na-achị ugbua kwuru na ọkụ latrik ga na-enwu kwa mgbe ma ọ bụrụ na-atụnyere onyeisiala Buhari n'afọ 2019.

BBC Igbo jụrụ onyeisi mgbasa ozi Enugu Electricity Distribution Company bụ Emeka Ezeh ajụjụ gbasara nke a. O kwuru na ọbụghị naanị ihe a na-ekweta na nkwa kama na ọ bụ site n'ịrụ ọrụ so ya n'azụ.

Ọ kwuru na ihe gbasara ọkụ latrik ekwesighi ịbụ ihe eji achụnta vootu dịka gọọmentị nakwa ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ji ya eme ugbua.

Ezeh gara n'ihu kwuo na gọọmentị anaghị emezu nkwa ha kwerela n'isi ọkụ latrik kamgbe ha bara ọchịchị.

Igwe ọkụ latrik

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Otụtụ ndị Naijiria na-atụ arịrị okpokpo ụgwọ ndị PHCN na-enye ha kwụọ kwa ọnwa
Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: